Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 11:44 - Bible Nso

44 Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

44 Onye ahụ nwụrụ anwụ pụtara, e jikwa akwa ozu kekọta aka ya na ụkwụ ya, werekwa akwa ịchafu kechie ihu ya. Jisọs sịrị ha, “Tọpụnụ ya, hapụ ya ka ọ laa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 11:44
20 Iomraidhean Croise  

Chineke we si, Ka ihè di: ìhè we di.


N'ihi na Ya onwe-ya kwuru okwu, o we di; Ya onwe-ya nyere iwu, o we guzo.


N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.


O we gwasie ha ike ka onye ọ bula ghara imara nka: O we si ka enye ya ihe-oriri.


Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà:


Onye ahu nke nwuru anwu we nọlie, malite ikwu okwu. O we were ya nye nne-ya.


Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru.


Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí.


Ya mere ha were aru Jisus, ke ya n'ezi ákwà-ozu, ya na udá utọ ndia, dika ndi-Ju nēme n'ilì ozu.


o we ruru ala nyo nime ya, hu ezi ákwà-ozu ahu ka ha tọb͕ọrọ; otú ọ di, ọ bàghi nime.


ichafọ kwa, nke diri n'isi-Ya, ya na ezi ákwà-ozu ahu atọb͕ọghi n'otù ebe, kama aturuworo ya debe n'otù ebe di iche.


N'ihi na dika Nnam nēme ndi nwuru anwu ka ha si n'ọnwu bilie, dika Ọ nēme kwa ka ha di ndu, otú a ka Ọkpara-Ya nēme kwa ka ndi Ọ nāchọ di ndu.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Oge hour nābia, ub͕u a ka ọ di kwa, mb͕e ndi nwuru anwu gānu olu Ọkpara Chineke; ndi nuru gādi kwa ndu.


Onye gēme aru nke ọnọdu-ayi di ala ka o nwe oyiyi ọhu, ka ya na aru nke ebube-Ya we nwekọ otù udi, dika ilusi-ọlu-ike ahu si di nke O ji pu ọbuná ido ihe nile n'okpuru Onwe-ya.


buru kwa Onye ahu nādi ndu; aghọ-kwa-ram onye nwuru anwu, ma le, anamadi ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi, enwe-kwa-ram nkpisi-ugodi nile nke ọnwu na nke Hedis


Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu: Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan