Ya mere ọra madu n'etiti ndi-Ju mara na Ọ nọ n'ebe ahu: ha we bia, ọ bughi n'ihi nání Jisus, kama ka ha we le kwa Lazarọs, onye Ọ mereri ka o si na ndi nwuru anwu bilie.
Ma mb͕e Pita huru ya, ọ zara ndi-Ju, si, Ndikom nke Israel, gini mere ihe a nēju unu anya? ma-ọbu gini mere unu nēlegide ayi anya, dika ọ bu site n'ike nke aka ayi? ma-ọbu dika ayi onwe-ayi nāsọpuru Chineke ka ayi meworo ya ka ọ je ije?
Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie.