Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 11:24 - Bible Nso

24 Mata si Ya, Amataram na o gēsi n'ọnwu bilie na nbilite-n'ọnwu n'ubọchi ikpe-azu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mata sịrị ya, “Amara m na ọ ga-ebili ọzọ nʼụbọchị mbilite nʼọnwụ nʼoge ikpeazụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 11:24
18 Iomraidhean Croise  

Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.


O lodawo ọnwu rue mb͕e ebighi-ebi; Onye-nwe-ayi Jehova gēhichapu kwa anya-miri n'iru nile; ita-uta nke ndi-Ya ka Ọ gēwezuga kwa n'elu uwa nile: n'ihi na Jehova ekwuwo ya.


Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.


N'aka ala-mọ ka M'gēsi b͕aputa ha; n'aka ọnwu ka M'gēme ka ha si pua nwere onwe-ha: òle ebe ajọ ọria-gi nile nke nēfe efe di, gi ọnwu? òle ebe nbipu-gi di, gi ala-mọ? agēzonari anyam abua nchèghari.


Ọ gēme ka ayi dighachi ndu mb͕e ubọchi abua gasiri: n'ubọchi nke-atọ ka Ọ gēme ka ayi bilie, ayi ewe di ndu n'iru Ya.


onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume.


Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie.


Ma nka bu ihe Onye ziterem nāchọ, ka M'ghara itufu ihe ọ bula nime ihe nile O nyeworo m, kama ka M'me ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.


N'ihi na nka bu ihe Nnam nāchọ, ka onye ọ bula nke nēle Ọkpara-Ya anya, nke nēkwere kwa na Ya, we nwe ndu ebighi-ebi; Mu onwem gēme kwa ka o si n'ọnwu bilie n'ubọchi ikpe-azu.


n'ihi na enwerem olile-anya n'ebe Chineke nọ, nke ndia onwe-ha nēche kwa, na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume na nke ndi ajọ omume kwa gaje idi.


Ndinyom natara ndi-ha ndi nwuru anwu site na nbilite-n'ọnwu: ma etib͕uru ndi ọzọ, ebe ha juru inata nb͕aputa-ha; ka ha we nata nbilite-n'ọnwu ka nma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan