22 Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n'aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi.
22 Ma ugbu a, amara m na Chineke ga-enye gị ihe ọbụla ị rịọrọ.”
Riọm, na agamenye gi mba nile ka ha buru ihe-nketa-gi, Na nsọtu uwa ka ha buru ihe-onwunwe-gi.
Jisus we biakute ha, gwa ha okwu, si, Ewerewo ike nile di n'elu-igwe na n'elu uwa nyem.
Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile.
Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie.
dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.
Nna nāhu Ọkpara-Ya n'anya, O nyewo kwa Ya ihe nile n'aka.
Ayi matara na Chineke adighi-anu olu ndi-nmehie: kama ọ buru na onye ọ bula bu onye nēbi isi ala nye Chineke, nēme kwa ihe Ọ nāchọ, onye ahu ka Ọ nānu.