Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 10:10 - Bible Nso

10 Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Onye ohi na-abịa naanị ka o zuo ohi, gbuo ma bibiekwa; abịara m ka ha nwe ndụ ma nwebigakwa ya oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 10:10
25 Iomraidhean Croise  

Nkita-ya nile nēribiga ihe ókè, ha amaghi afọ-ojuju; ndi ahu bu kwa ndi-ọzùzù-aturu nāmaghi ighọta ihe: ha nile echewo uzọ nke aka ha iru, onye ọ bula ọ che urù-ya iru site n'akuku nile ọ bula.


Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.


Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.


N'ihi na Nwa nke madu biara izọputa ndi nile furu efu.


dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.


Ọ si ha, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere: ma unu onwe-unu nēme ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.


Ma ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe n'iru madu: n'ihi na unu onwe-unu abataghi, unu adighi-ekwe kwa ndi nābata ka ha bata.


O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe.


N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe.


Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya.


Ọ buru kwa na onye ọ bula anu okwum, ghara idebe ha, Mu onwem agaghi-ekpe ya ikpé: n'ihi na abiaghm ka M'kpe uwa ikpé, kama ka M'zọputa uwa.


Ma nka ka o kwuru, ọ bughi n'ihi na ọ kpọrọ ndi-ob͕eye ihe; kama n'ihi na ọ bu onye-ori, na ebe o ji àkpà-ego, ọ nēwepu ihe anētiye nime ya.


N'ihi na Chineke eziteghi Ọkpara-Ya n'uwa ka O kpe uwa ikpé; kama ka ewe site n'aka-Ya zọputa uwa.


unu achọghi kwa ibiakutem, ka unu we nwe ndu.


N'ihi na nri nke Chineke bu nke ahu nke nēsi n'elu-igwe aridata, nke nēnye kwa uwa ndu.


Mu onwem bu nri di ndu nke siri n'elu-igwe ridata: ọ buru na madu erie ufọdu nime nri a, ọ gādi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: ma nri nke Mu onwem gēnye kwa bu anu-arum, n'ihi ndu nke uwa.


ya mere gi onye nēzí madu-ibe-gi ihe, ì dighi-ezí onwe-gi? gi onye nēkwusa ka madu ghara izu ori, ì nēzu ori?


Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha:


N'otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:


O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha.


n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan