Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 1:49 - Bible Nso

49 Nataniel zara Ya, si, Rabai, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke; Gi onwe-gi bu Eze Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

49 Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, “Onye ozizi, ị bụ Ọkpara Chineke; ị bụ eze Izrel.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 1:49
31 Iomraidhean Croise  

Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Ma Mu onwem emewo ka ezem guzosie ike N'elu Zaion, bú ugwu nsọm.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Jehova ewezugawo ikpé-gi nile, Ọ chughachiwo onye-iro-gi: Eze Israel, bú Jehova, nọ n'etiti gi: i gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọzọ.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Ma ndi nọ n'ub͕ọ ahu kpọrọ isi ala nye Ya, si, I bu Ọkpara Chineke n'ezie.


si, Òle ebe Ọ nọ, bú Onye amuru ibu Eze ndi-Ju? n'ihi na ayi huru kpakpando-Ya n'Ọwuwa-anyanwu, ayi we bia ikpọ isi ala nye Ya.


Sinu ada Zaion, Le, Eze-gi nābiakute gi, Ọ di nwayọ, Ọ nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, Na n'elu nwa-inyinya-ibu, bú nwa anu nēbu ibu.


na ekele n'ọma-ahia nile unu, na ka madu nākpọ ha, Rabai.


Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.


Ma Jisus guzoro n'iru onye-isi: onye-isi ahu we jua Ya, si, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? Jisus we si ya, Gi onwe-gi kwuru.


Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.


Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.


Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.


si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu.


Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.


Mu onwem ahuwo kwa, b͕a kwa àmà na Onye a bu Ọkpara Chineke.


Jisus we chigharia, kiri ha ka ha nēso Ya, Ọ si ha, Gini ka unu nāchọ? Ha we si Ya, Rabai (nke isi-ya bu, ma asugharia ya, Onye-ozizí), òle ebe I bi?


Jisus zara, si ya, N'ihi na M'siri gi, Ahurum i n'okpuru osisi fig, ì kwere ekwe? i gāhu ihe kariri ihe ndia uku.


Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum.


Mb͕e ihe ndia nēme ndi nēso uzọ-Ya nāriọ Ya, si, Rabai, rie ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan