Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 1:42 - Bible Nso

42 O duru ya biakute Jisus. Jisus lere ya anya, si, Gi onwe-gi bu Saimon nwa Jọn: agākpọ gi onwe-gi Kifas (nke bu Pita, ma asugharia ya).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Ọ kpọtaara ya Jisọs. O lere ya anya sị, “Ị bụ Saimọn nwa Jọn. A ga-akpọ gị Sefas” (nke nsụgharị ya, pụtara Pita).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 1:42
20 Iomraidhean Croise  

Otù onye we ba, gosi onye-nwe-ya, si, Otú a na otú a ka nwa-ab͕ọghọ ahu nke sitere n'ala Israel kwuru.


Ma aha ndi-ozi iri na abua ahu bu ndia: Onye mbu, Saimon, onye anākpọ Pita, na Andru nwa-nne-ya; na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya;


Saimon ka O nyekwasiri aha Pita;


Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi.


Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu,


Ekwughm okwu bayere unu nile: Mu onwem matara ndi M'rọputara: kama ọ bu ka emezu ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Onye nēri nrim buliri ikiri-ukwu-ya imegidem.


Saimon Pita, na Tomas anākpọ Didimọs, na Nataniel, bú onye Kena nke Galili, na umu nke Zebedi, na madu abua ọzọ nime ndi nēso uzọ-Ya, nọkọrọ n'otù ebe.


Jisus si ya, Laba, kpọ di-gi, bia kwa n'ebe a.


Ihe m'nēkwu bu nka, na unu nile n'otù n'otù nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mu onwem bu kwa nke Apọlos; mu onwem bu kwa nke Kifas; mu onwem bu kwa nke Kraist.


na O me-kwa-ra ka Kifas hu Ya anya; emesia O mere ka ndi-ozi iri na abua ahu hu Ya anya;


ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu;


Ọ̀ gābu na ayi enweghi ike ikuru nwunye, bú nwa-nna-nwanyi nime Kraist, jeghari, dika ndi-ozi fọduru nēme kwa, ha na umu-nne Onye-nwe-ayi, na Kifas?


Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise.


Ma mb͕e Kifas biaruru Antiọk, eguzogiderem ya n'iru, n'ihi na ọ nọ n'ọmuma-ikpé.


mb͕e ha hukwara amara enyerem, Jemes na Kifas na Jọn, bú ndi akpọrọ ide, nara mu na Banabas aka-nri nke nnwekọ, ka ayi onwe-ayi we jekuru ndi mba ọzọ, ka ha onwe-ha we jekuru kwa ndi obibì-úgwù;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan