Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 1:41 - Bible Nso

41 Onye ahu buru uzọ chọta nwa-nne nke aka ya, bú Saimon, si ya, Ayi ahuwo Mesaia-ayi (nke bu, ma asugharia ya, Kraist).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 Ihe mbụ o mere bụ ịchọta Saimọn nwanne ya sị ya, “Anyị achọtala Mezaya ahụ” (onye a na-akpọkwa Kraịst).

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 1:41
21 Iomraidhean Croise  

Ha we sirita onwe-ha, Ọ bughi ihe ziri ezi ka ayi onwe-ayi nēme: ubọchi ta, ubọchi ozi ọma ka ọ bu, ma ayi onwe-ayi nāb͕a nkiti: ọ buru na ayi echere rue ìhè ututu, ajọ omume-ayi gāchọputa ayi: ma ub͕u a bianu, ka ayi ba gosi ulo eze.


Ndi-eze nke uwa nēguzo onwe-ha, Ndi-isi nāb͕akọta kwa ìzù, Imegide Jehova, na imegide onye-Ya etere manu, si,


I huwo ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì: N'ihi nka Chineke, bú Chineke-gi, tere gi Manu obi-utọ n'isi kari ndi-ibe-gi.


Achọtawom Devid, bú orùm; Ewerewom manu nsọm te ya:


Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;


Mọ nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, di n'arum; n'ihi na Jehova etewom manu izì ndi ewedara n'ala ozi ọma; O zitewom ikechi ọnyá ndi obi-ha tiwara etiwa, ikpọsa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, na ikpọsa nmeghepu ulo-nkpọrọ gwa ndi ekere ab͕u;


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


Ma mb͕e ha huru ya, ha me ka amara okwu agwara ha-ri bayere Nwatakiri ahu.


O we bia rue ebe ahu n'otù oge hour ahu, we kele Chineke, gwa kwa ndi nile nēche nb͕aputa nke Jerusalem okwu bayere Ya.


Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef.


Nwanyi ahu si Ya, Amataram na Mesaia nābia (Onye anākpọ Kraist): mb͕e ọ bula Onye ahu gābia, Ọ gākọrọ ayi ihe nile.


bú Jisus Nke si na Nazaret puta, otú Chineke were Mọ Nsọ na ike te Ya dika manu-otite: Onye jeghariri nālu ọlu ọma, nēme kwa ka aru di ha ike, bú ndi nile ekwensu mere ha dika onye-nwe-ha; n'ihi na Chineke soro Ya.


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


ọ bu ihe ayi huworo, nu kwa, ka ayi nākọkwara unu, ka unu onwe-unu we so kwa ayi nwekọ ya: ma nnwekọ-ayi bu kwa nke ayi soro Nna-ayi, so kwa Ọkpara-Ya Jisus Kraist, nēnwekọ:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan