Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 1:3 - Bible Nso

3 Ekère ihe nile site n'aka-Ya; ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọghi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 E sitere na ya kee ihe niile, ọ dịghịkwa ihe ọbụla e kere eke nke a na-ekeghị site na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 1:3
20 Iomraidhean Croise  

Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.


Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa.


Na mb͕e ochie ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa; Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa.


Okwu Jehova ka ejiri me elu-igwe; Eji-kwa-ra iku-ume nke ọnu-Ya me usu-ha nile.


Anọkwam n'akuku Ya, dika onye-ọ̀kà: M'we buru ihe nātọ Ya utọ kwa-ubọchi, Nēgwuri egwú n'iru Ya mb͕e nile;


Mu onwem emewo uwa, kè kwa madu n'elu ya: Mu onwem, akam abua setiri elu-igwe, ọ bu usu nile nke ihe-ha M'nyeworo iwu.


N'ihi na otú a ka Jehova Nke kèworo elu-igwe siri; Ya onwe-ya bu Chineke: Onye kpuworo uwa, me ya; Ya onwe-ya mere ka o guzosie ike, ọ bughi ihe tọb͕ọrọ n'efu ka Ọ kère ya, ọ bu ka ewe biri nime ya ka Ọ kpuru ya: Mu onwem bu Jehova; ọ dighi kwa Chineke ọzọ di.


Ọ nọri n'uwa, ekèkwara uwa site n'aka-Ya, uwa amaghi kwa Ya.


Onye ahu na Chineke diri na mbu.


ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya.


na inye ha nile ìhè ihu ihe bu ọchichi-èzí-na-ulo nke ihe-omimi ahu nke ezoworo nime Chineke site n'oge nile, Onye kère ihe nile;


Okwukwe ka ayi ji ghọta na ewerewo okwu Chineke dozie uwa nile, ya mere esiteghi n'ihe putaworo ìhè kpu ihe ahu anāhu anya.


Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Leọdisia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Amen ahu nēkwu, bú Onye-àmà ahu Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke bu kwa Onye-ezi-okwu, Isi nke ihe nile Chineke kère:


Gi, Onye-nwe-ayi na Chineke-ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n'ihi na Gi onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n'ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekè-kwa-ra ha èkè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan