Gideon we ziga ndi-ozi n'ugwu Efraim nile, si, Ridatanu izute Midian, burunu ha uzọ were miri, rue Bet-bara, bú Jọdan. Ndikom nile nke Efraim we kpọkọta onwe-ha, were miri ahu rue Bet-bara, bú Jọdan.
Ha we biakute Jọn, si ya, Rabai, Onye gi na Ya nọ n'ofè Jọdan, Onye gi onwe-gi b͕aworo àmà nye Ya, le, Onye ahu nēme baptism, madu nile nābiakute kwa Ya.