20 O we kwuputa, ọ gọghi kwa agọ; ma o kwuputara, si, Mu onwem abughi Kraist ahu.
20 O mechighị ọnụ ya, kama o kwupụtara sị, “Abụghị m Kraịst ahụ.”
Ya onwè-ya abughi Ìhè ahu, kama ọ biara ka o we b͕ara Ìhè ahu àmà.
Ma mb͕e Jọn nāb͕azu ọsọ-ya, ọ si, Gini ka unu nēchè na abum? Mu onwem abughi Ya. Kama, le, otù Onye nābia n'azum, Onye m'nēkwesighi itọpu akpukpọ-ukwu nke ukwu-Ya.