Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Oziọma Jọn 1:13 - Bible Nso

13 ndi amuru, ọ bughi site n'ọbara, ọ bughi kwa site n'ọchichọ anu-aru, ọ bughi kwa site n'ọchichọ nwoke, kama site na Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ụmụ a na-amụghị site nʼọbara, maọbụ site na mkpebi nke anụ ahụ, ma ọ bụkwanụ mkpebi nke mmadụ, kama site na Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Oziọma Jọn 1:13
25 Iomraidhean Croise  

Umu-ya we b͕a nb͕a nime afọ ya; ọ si, Ọ buru na ọ di otú a, n'ìhi gini kwa ka mu onwem di ndu? Ọ we je iju Jehova ase.


Aisak we hu Isọ n'anya, n'ihi na ihe achutara na ntá nātọ ya utọ n'ọnu: ma Rebeka huru Jekob n'anya.


Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa.


sierem nri utọ, dika nke m'huru n'anya, butekwara m, ka m'we rie; ka nkpuru-obim we gọzie gi tutu mu anwua.


Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.


unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.


Jisus zara, si ya, N'ezie, n'ezie, asi mi, Ọ buru na amughi madu ọzọ, ọ pughi ihu ala-eze Chineke anya.


Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.


n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.


O siteghi n'ọlu di iche iche aluru n'ezi omume, nke ayi onwe-ayi luru, zọputa ayi, kama dika ebere-Ya si di, site n'ọsisa nke imu-ọzọ na nke ime ọhu nke Mọ Nsọ nēme,


N'ihi na O zubere ya O were okwu nke ezi-okwu muputa ayi, ka ayi we buru otù aha nkpurú mbu nke ihe O kère èkè.


ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,


dika umu amuru ọhu, ka agu miri-ara nke okwu Chineke, nke aghughọ nādighi ya, nāgusi unu ike, ka unu we were ya nētó etó rue nzọputa;


Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-eme nmehie, n'ihi na nkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pughi kwa imehie, n'ihi na amuwo ya site na Chineke.


Ndi m'huru n'anya, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya: n'ihi na ihu-n'anya bu ihe si na Chineke puta; onye ọ bula nke nāhu n'anya bu kwa onye amuworo site na Chineke, ọ ma-kwa-ra Chineke.


Onye ọ bula nke kwere na Jisus bu Kraist ahu, amuwo ya site na Chineke: ọzọ onye ọ bula nke nāhu Onye ahu Nke muru n'anya, ọ nāhu kwa onye ahu nke amuworo site na Ya n'anya.


Ayi matara na onye ọ bula nke amuworo site na Chineke adighi-emehie; kama Onye ahu Nke amuru Ya site na Chineke nēdebe ya, ajọ onye ahu adighi-emetu kwa ya aka.


N'ihi na ihe ọ bula nke amuworo site na Chineke nēmeri uwa: nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan