N'ihi na ihe nile ndia ka akam meworo, ihe ndia nile ewe di, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: ma onye a ka M'gēlegide, ọbuná onye ewedara n'ala nke etib͕u-kwa-ra mọ-ya etib͕u, onye nāma kwa jijiji n'okwum.
Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.
Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.
Ya mere ziga na Jọpa, kpọtara onwe-gi Saimon, onye anākpọ kwa Pita; onye ahu nānọ dika ọbìa n'ulo Saimon, bú onye nēdozi akpukpọ anu n'usọ oké osimiri.
M'we si, Gini ka m'gēme, Onye-nwe-ayi? Onye-nwe-ayi we sim, Bilie, ga ba na Damaskọs; n'ebe ahu ka agāgwa kwa gi okwu bayere ihe nile nke akaworo gi ka i me.
Ma bilie, guzo kwa n'ukwu-gi: n'ihi na emere ka i hum anya ka M'we me ihe a, irọputa gi ka i buru onye nēje ozi na onye-àmà nke ihe i hurum nime ha, na nke ihe M'gēme ka i hum anya nime ha;
Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku;