Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.
N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ bu mb͕e nsọpuru gasiri ka O ziworom jekuru mba nile ndi nākwata unu: n'ihi na onye nēmetu unu aka nēmetu nwa-anya-Ya.
Ya mere mb͕e ha risiri nri-ututu-ha, Jisus si Saimon Pita, Saimon, nwa Jọn, ì hurum n'anya kari ndia? Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi; Gi onwe-gi matara na I bu eyìm. Ọ si ya, Nēnye umu-aturum nri.
Ya mere le obi-ọma na aka-ike nke Chineke: n'aru ndi ndi a ka aka-ike-Ya dakwasiri; ma n'aru gi ka obi-ọma Chineke nādikwasi, ma ọ buru na i gānọgide n'obi-ọma-Ya: ebe agēbipu kwa gi onwe-gi ma ọ buru na i nọgideghi otú a.
N'ihí na dika aru-ayi bu otù, nwe kwa ọtutu ihe di ya nime, ma ihe nile nke di n'aru, ọ bu ezie na ha di ọtutu, ma ha bu otù aru; otú a ka Kraist di kwa.
N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?