Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 8:9 - Bible Nso

9 Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 8:9
20 Iomraidhean Croise  

Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.


Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.


Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.


Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.


Onye nēkwu site n'onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahu bu onye ezi-okwu, ajọ omume adighi kwa nime ya.


Mb͕e ha gabigasiri n'agwe-etiti ahu dum rue Pafọs, ha hu otù nwoke nke bu onye-mb͕asi, onye-amuma ugha, onye-Ju, aha-ya bu Ba-Jisus;


Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n'ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n'okwukwe-ayi.


N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.


Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya.


onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.


N'ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n'anya, ndi nāhu ego n'anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n'obi,


ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.


N'ihi na, ebe ha nēkwu oké okwu na mbuli elu nke ihe-efu, ha were agu ikwa-iko di iche iche nārafu ndi ahu nime agu ihe ọjọ nke anu-aru, bú ndi nāb͕anari n'oge ub͕u a ndi nēbi obi na njehie;


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan