Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 7:8 - Bible Nso

8 O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 7:8
20 Iomraidhean Croise  

Jehova we hu na onye anākpọ asì ka Lia bu, Ọ we meghe àkpà-nwa-ya: ma Rechel bu nwayi-àgà.


Bilha we turu ime, muara Jekob nwa-nwoke.


Ha we si na Bet-el bulie ije; ma uzọ fọduru ibiaru Efrat: Rechel we nāmu nwa, ime nēmesi kwa ya ike mb͕e ọ nāmu nwa.


O rue, mb͕e nkpuru-obi-ya nāpu (n'ihi na ọ nwuru), na ọ kpọrọ aha-ya Ben-oni: ma nna-ya kpọrọ ya Benjamin.


Abraham muru Aisak. Umu-ndikom Aisak; Isọ, na Israel.


Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya;


Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù.


Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta.


Èsi kwa aṅa gu ya? àguru ya nye ya mb͕e ọ nọ n'obibì-úgwù, ma-ọbu mb͕e ọ nọ n'ebìghi-úgwù? Ọ bughi n'obibì-úgwù, kama ọ bu n'ebìghi-úgwù:


Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya.


Ma nka bu ihe m'nēkwu; Ọb͕ub͕a-ndu nke Chineke buruworo uzọ dozie nke-ọma, iwu ahu, nke putara mb͕e nnù arọ na orú arọ na iri gasiri, ewezugaghi ọb͕ub͕a-ndu ahu, ime nkwa ahu ka ọ ghara idi irè.


Ma lenu otú onye a di uku, onye Abraham, bú nna-ayi mbu, nyere otù uzọ n'uzọ iri n'isi ihe alutara n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan