Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu.
O rue, n'arọ nke-nnù-na-ọgu-anọ site na mb͕e umu Israel siri n'ala Ijipt putasia, n'arọ nke-anọ nke Solomon bu eze Israel, n'ọnwa Ziv, nke bu ọnwa nke-abua, na o wubere Jehova ulo.
O rue, mb͕e Devid biri n'ulo-ya, na Devid siri Netan, bú onye-amuma, Le, mu onwem nēbi n'ulo cedar, ma ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nēbi n'okpuru ákwà-nkwuba.
Solomon we malite iwu ulo Jehova nime Jerusalem n'ugwu Moraia, ebe Jehova mere ka Devid, bú nna-ya, hu Ya anya, nke o doziri n'ebe Devid rọputara, n'ebe-nzọcha-ọka Ọnan, bú onye Jebus.