Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 6:7 - Bible Nso

7 Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 6:7
25 Iomraidhean Croise  

Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ.


N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba.


Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà-ya ka M'gēyikwasi nzọputa dika uwe: Ndi-ebere-ya gētisi kwa nkpu ọṅù ike.


Ka ndi-nchu-àjà-Gi yiri ezi omume dika uwe; Ka ndi-ebere-Gi tikwa nkpu ọnu.


Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.


Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide;


Otú ọ di, ọbuná site n'etiti ndi-isi ọtutu kwere na Ya; ma n'ihi ndi-Farisi ha ekwuputaghi ya, ka aghara ichupu ha n'ulo-nzukọ:


Ma okwu Chineke nāga n'iru, nāba kwa uba.


Ma Elimas, bú onye-mb͕asi ahu, (n'ihi na otú a ka aha-ya di ma asugharia ya), nēguzogide ha, nāchọ uzọ iduhie onye-isi ahu n'okwukwe-ayi.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Otú a ka okwu Onye-nwe-ayi were ike nāga n'iru n'iru nādi kwa irè.


ha nēto Chineke, ihe-ha nātọ kwa ndi-Ju dum utọ. Onye-nwe-ayi nātukwasi-kwa-ra ha kwa-ubọchi ndi anāzọputa.


Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:


Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.


Onye ayi sitere n'aka-Ya nata amara na ọlu onye-ozi, rue iṅa-nti nke okwukwe n'etiti mba nile, n'ihi aha-Ya:


ma ub͕u a ka emere ka ọ puta ìhè, esite kwa n'ihe ndi-amuma deworo n'akwukwọ me ka mba nile mara ya, dika ihe Chineke ebighi-ebi nyere n'iwu si di, rue iṅa-nti nke okwukwe;


ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n'oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n'oge gara aga;


Ya mere otú a, otú ayi nwere oge, ka ayi nālu ezi ihe n'ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n'ebe ndi èzí-na-ulo nke okwukwe-ayi nọ.


nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;


nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:


nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u.


Mb͕e akpọrọ Abraham, okwukwe ka o ji ṅa nti ipu je ebe nke ọ gaje inara ka ọ buru ihe-nketa; o we pua, nāmaghi ebe ọ nēje.


ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;


Ma unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, n'iwuli onwe-unu elu dika ulo n'elu okwukwe-unu dikarisiri nsọ, n'ikpe kwa ekpere nime Mọ Nsọ,


Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan