Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 6:5 - Bible Nso

5 Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mmadụ niile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke jupụtara nʼokwukwe na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, Prokorọs, Nikanọ, Timọn, Pamenas na Nikolas, onye Antiọk na-eso ụzọ ofufe ndị Juu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 6:5
24 Iomraidhean Croise  

Ihe ahu di nma n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya nile.


Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.


Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku!


Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.


Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi, ndi-iru-abua; n'ihi na unu nējeghari n'oké osimiri na ala kpọrọ nku buruburu ka unu me otù onye ka o so uzọ-unu; ma mb͕e ọ ghọrọ otú ahu, unu nēme ya okpukpu abua nwa ọku ala-mọ kari onwe-unu.


Ya mere ndi b͕asara site na nkpab͕u nke putara n'ihi Stifen jeruru Finisia, na Saiprọs, na Antiọk, ha adighi-agwa onye ọ bula okwu Chineke ma-ọbughi nání ndi-Ju.


Ma ufọdu di n'etiti ha, ndikom nke Saiprọs na Sairini, ndi, mb͕e ha biaruru Antiọk, ha gwa kwa ndi-Grik okwu ahu, nēzisa ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus.


Akukọ bayere ha we ba na nti nzukọ Kraist di na Jerusalem: ha we zipu Banabas ije rue Antiọk:


n'ihi na ọ bu ezi nwoke, juputa kwa na Mọ Nsọ na okwukwe: ewe tukwasi oké ìgwè madu nye Onye-nwe-ayi.


mb͕e ọ chọtara ya, o we kuru ya bia Antiọk. O we rue, na ọbuná ogologo otù arọ ha zukọrọ na nzukọ Kraist, zí kwa oké ìgwè madu ihe; na ọ bu kwa n'Antiọk ka eburu uzọ kpọ ndi nēso uzọ Jisus ndi-Kristian.


Ma na mb͕e ahu ndi-amuma ufọdu siri na Jerusalem ridata n'Antiọk.


Ma ndi-amuma na ndi-ozizí di n'Antiọk, nime nzukọ Kraist di n'ebe ahu, bú Banabas, na Simeon onye anākpọ Naiga, na Lusiọs onye Sairini, na Manaen onye azùkọrọ ya na Herod, bú tetrarch, na Sọl.


Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:


Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.


Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.


mb͕e anāwusi ọbara Stifen onye-àmà-Gi, mu onwem guzo-kwa-ra nso, o we dim ezi nma, anamedebe kwa uwe nke ndi nēb͕u ya.


Ha enweghi kwa ike iguzogide amam-ihe na Mọ Nsọ o ji ekwu okwu.


Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.


Ma Stifen, ebe o juputara n'amara na ike, ọ nālu oké ọlu-ebube na ihe-iriba-ama di iche iche n'etiti ndi-Ju.


Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a?


Otú a, gi onwe-gi nwe-kwa-ra ufọdu ndi nējidesi ozizí ndi-Nikọlaitan ike otú ahu.


Otú ọ di, nka ka i nwere, na i nākpọ ọlu nile nke ndi-Nikọlaitan asì, bú nke Mu onwem nākpọ kwa asì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan