Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 6:3 - Bible Nso

3 Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ụmụnna anyị, sitenụ nʼetiti unu họpụta ndị ikom asaa ndị a na-agbara ezi ama na ha jupụtara na Mmụọ Nsọ na amamihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nʼaka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 6:3
34 Iomraidhean Croise  

Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


N'ihi na Chineke-ya nādọ ya aka na nti iluzi aluzi, O nēzí ya ihe.


Ọ gāghọ-kwa-ra onye nānọkwasi n'oche ikpé mọ nke ikpé, Ọ gāghọ-kwa-ra ndi nāchughachi ndi nēbu agha rue ọnu-uzọ-ama idi-ike.


Ma ka aghara ikpọ unu onwe-unu, Rabai: n'ihi na otù Onye bu Onye-ozizí-unu, ma unu onwe-unu nile bu umu-nna.


Ya mere okwu a putara n'etiti umu-nna nime Kraist, na onye ahu nke nēso uzọ-Ya agaghi-anwu: ma Jisus asighi ya, na ọ gaghi-anwu; kama, Ọ buru na anamachọ ka ọ nọgide rue mb͕e M'gābia, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ?


Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),


Ya mere otù onye nime ndikom ndi soro ayi n'oge nile Onye-nwe-ayi Jisus bàra nime pu kwa n'èzí n'etiti ayi,


Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.


ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:


Umu-nna nime Kraist ndi bi na Listra na Aikọniọm b͕ara onye ahu ezi àmà.


Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.


Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà,


ebe ayi huru umu-nna nime Kraist, ewe riọ ayi ka ayi na ha nọgide ubọchi asa: otú a ayi we bia rue Rom.


Ndi-ozi iri na abua ahu we kpọ ọra ndi nēso uzọ Jisus biakute ha, si, Ọ dighi utọ ka ayi rapu okwu Chineke, jere table ozi.


Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:


ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.


Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs.


N'ihi na anēsite n'aka Mọ Nsọ nye otù onye okwu amam-ihe; anēnye kwa onye ọzọ okwu ọmuma, di ka Mọ ahu nāchọ:


Ma mb͕e ọ bula m'biaruru, ndi ọ bula unu gānwaputa, m'gēwere akwukwọ-ozi ziga ndi ahu ibūru ihe-amara-unu je Jerusalem:


Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;


Doro onwe-unu ndikom mara ihe, ndi nwe-kwa-ra nghọta, ndi ama-kwa-ra aha-ha, dika ebo nile unu si di, m'gēdo kwa ha ndi-isi-unu.


onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.


Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.


Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan