Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 5:3 - Bible Nso

3 Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 5:3
25 Iomraidhean Croise  

I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?


Ọnyà mara madu ma ọ buru na o were ọsọsọ si, Ọ di nsọ, Ma mb͕e ọ kwesiri nkwa o we ju ajuju.


Mb͕e i nēkwe Chineke nkwa, alala azu n'ikwughachi ya; n'ihi na ihe ndi-nzuzu adighi-atọ Ya utọ: ihe i nēkwe na nkwa, kwughachi ya.


Ahuhu gādiri ndi nēzonari Jehova ndum-ọdu-ha n'ebe di omimi, ndi ọ bu kwa n'ọchichiri ka anālu ọlu nile ha, ha we si, Ònye nāhu ayi? ma-ọbu ònye mara ayi?


Ọ̀ di onye ọ bula gēzobe onwe-ya n'ebe ọ bula di nzuzo, Mu onwem we ghara ihu ya anya? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi elu-igwe na uwa ka M'juputara? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Efraim ji okwu-ugha ab͕am buruburu, ọ bu kwa aghughọ ka ulo Israel ji: Juda nọ kwa nālupu alupu n'aka Chineke, bú n'aka Onye kachasi nsọ Nke kwesiri ntukwasi-obi.


Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n'ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme.


Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ.


Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu.


Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye,


Mb͕e enyesiri ya iberibe achicha ahu, mb͕e ahu Setan batara nime onye ahu. Ya mere Jisus si ya, Ihe i nēme, me ya ọsọsọ.


we debere onwe-ya ufọdu nime ọnu-ahia-ya, nwunye-ya ma-kwa-ra, o we weta otù òkè, tọb͕ọ ya n'ukwu ndi-ozi.


Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.


Ma Pita siri ya, Gini mere unu nwere otù olu inwa Mọ nke Onye-nwe-ayi? le, ukwu nke ndi lìri di-gi di n'ọnu-uzọ, ha gēbupu kwa gi.


Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.


Ya mere donu onwe-unu n'okpuru Chineke; ma guzogidenu ekwesu, ọ gāb͕apu kwa n'ebe unu nọ.


Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan