Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 4:14 - Bible Nso

14 Ebe ha hu-kwa-ra nwoke ahu nke emereri ka aru di ya ike ka ya na ha nēguzo, ha enweghi ihe ikwugide ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma mgbe ha hụrụ nwoke ahụ a gwọrọ, ka o guzo nʼakụkụ ha, ha enweghị okwu ọbụla ha nwere ikwu megide nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 4:14
7 Iomraidhean Croise  

Ya mere ebe anāpughi irughari ihe ndia uka, unu aghaghi ijurú, na ighara ime ihe nēchèghi echè.


ka eme ka unu nile na ndi Israel nile mara, na ọ bu n'aha Jisus Kraist Onye Nazaret, Onye unu onwe-unu kpọgidere n'obe, Onye Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ bu n'aha nka ka onye a ji aru di nma guzo n'iru unu n'ebe a.


Ma mb͕e ha huru nkwuwa-okwu nke Pita na Jọn, mb͕e ha ghọta-kwa-ra na ha bu ndi nāmaghi ihe na ndi nāmutaghi akwukwọ ri nne, o ju ha anya; ha we mata ha, na ha na Jisus anọwori.


Ma mb͕e ha gwasiri ha ka ha si na nnọkọ-ikpé-ha pua n'èzí, ha b͕a ìzù n'etiti onwe-ha,


si, Gini ka ayi gēme madu ndia? n'ihi na ọ putara ìhè nye ndi nile bi na Jerusalem, na ọ bu ezie na emewo ihe-iriba-ama amara nke-ọma site n'aka-ha; ayi apughi kwa igọ ya.


Ma mb͕e ha basiri ha nba ọzọ, ha rapu ha ka ha la, ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi me ka ha hu ahuhu-nmehie, n'ihi ndi-Ju; n'ihi na madu nile nēnye Chineke otuto bayere ihe emeworo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan