Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 3:22 - Bible Nso

22 Moses kwuru n'ezie, si, Onye-nwe-ayi Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu; Onye ahu ka unu gēge nti n'ihe nile, ka ha ra, bù nke Ọ gāgwa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 3:22
22 Iomraidhean Croise  

Ìgwè madu ahu we nāsi, Nwoke a bu Onye-amuma ahu, Jisus, Nke si na Nazaret nke Galili bia.


Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem.


Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile:


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Mu onwem abiawo n'uwa ibu ìhè, ka onye ọ bula nke kwere na Mu we ghara inọgide n'ọchichiri.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nānu okwum, nke nēkwere kwa Onye ziterem, o nwere ndu ebighi-ebi, ọ biaghi kwa n'ikpé, kama o sitewo n'ọnwu ba na ndu.


Ya mere Jisus gwara ha okwu ọzọ, si, Mu onwem bu Ìhè nke uwa: onye nēsom agaghi-ejeghari n'ọchichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu.


Onye a bu Moses ahu, onye siri umu Israel, Chineke gēme ka Onye-amuma, Nke di ka mu onwem, biliere unu site n'etiti umu-nne-unu.


N'ihi na ihe iwu ahu nāpughi ime, nke ọ nādighi ike nime ya site n'anu-aru, Chineke mere, n'ihi na Ọ mara nmehie ikpé n'anu-aru, mb͕e O zitere Ọkpara nke aka Ya n'oyiyi nke anu-aru nmehie na dika àjà achuru n'ihi nmehie:


ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


ma mb͕e oge ahu zuru, Chineke ziputara Ọkpara-Ya, Onye amuru site na nwanyi, Onye amuru n'okpuru iwu,


N'ihi nka ayi aghaghi iṅabiga nti ókè kari n'ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n'ebe ha di ma eleghi anya, dika miri nēbupu ub͕ọ.


ebe emesiri Ya ka O zue okè, O we ghọrọ ndi nile nāṅa Ya nti Onye nēwetara ha nzọputa ebighi-ebi;


Nkpughe nke Jisus Kraist, nke Chineke nyere Ya igosi ndi-orù-Ya, bú ihe nāghaghi iputa n'isi nso: O we site n'aka mọ-ozi-Ya ziga we gosi Jọn orù-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan