Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 3:14 - Bible Nso

14 Ma unu onwe-unu gọnariri Onye Nsọ na Onye Ezi Omume ahu, we riọ ka ewere amara nye unu ob͕u-madu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Unu gọnarịrị onye ahụ dị nsọ bụrụkwa onye ezi omume, ma rịọ ka a hapụrụ unu ogbu mmadụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 3:14
22 Iomraidhean Croise  

N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye rafuru ìgwè madu nile ka ha riọ ya Barabas, ma la Jisus n'iyì.


si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? Amataram gi Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.


Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus.


Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu.


Mọ-ozi ahu we za, si ya, Mọ Nsọ gābiakwasi gi, ike nke Onye kachasi ihe nile elu gēkpuchi kwa gi: n'ihi nka Ihe di nsọ nke i di ime Ya, agākpọ Ya Ọkpara Chineke.


O we rapuru ha onye ahu atubàrari n'ulo-nkpọrọ n'ihi nbili imegide ndi-isi na ib͕u-madu, onye ha riọrọ n'aka-ya; ma ọ rara Jisus nye ka eme Ya ihe ha chọrọ.


ezi omume, n'ihi na anamalakuru Nnam, unu adighi-ahu-kwam ọzọ site n'ub͕u a;


Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.


Ọ bu ezie na ha ahughi ihe ọ bula kwesiri ọnwu n'aru Ya, ma ha riọrọ Pailet ka eb͕ue Ya.


N'ihi na I gaghi-arapu nkpuru-obim nime Hedis, I gaghi-enye kwa Onye nke Gi di ọcha n'obi ka Ọ hu ire-uré.


O we si, Chineke nke nna-ayi-hà rọputara gi imara ihe Ọ nāchọ, na ihu Onye Ezi Omume ahu, na inu olu si n'ọnu-Ya puta.


n'ihi na ọ bu ezie na nime obodo a Herod na Pọntiọs Pailat, ha na ndi mb͕a ọzọ na ndi Israel nile, zukọrọ imegide Onye Nsọ ahu nējere Gi ozi, bú Jisus, onye I tere manu n'isi,


si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.


Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Unu mara ikpé, unu b͕uru onye ezi omume ahu; ọ dighi-edo onwe-ya imegide unu.


N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;


Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Filadelfia akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye di Nsọ, Onye-ezi-okwu, Onye nwere nkpisi-ugodi nke Devid, Onye nēmeghe, ọ dighi kwa onye ọ bula gēmechi, Onye nēmechi kwa, ọ dighi kwa onye ọ bula nēmeghe:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan