Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 28:3 - Bible Nso

3 Ma mb͕e Pọl chikọtasiri ùkwù nkù, tukwasi ha n'ọku, aju-ala we si n'okpom-ọku ahu puta, ta ya alu kokwasi kwa ya n'aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼoge Pọl na-achịkọta nkụ itinye nʼọkụ a, otu agwọ ajụala sitere nʼime nkụ na-enwu ọkụ mapụta nʼihi okpomọkụ tụhịkọ onwe ya nʼaka ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 28:3
13 Iomraidhean Croise  

Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.


Ibu eboro anumanu nile nke Negeb. N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.


Le, unu onwe-unu sitere n'ihe nābughi ihe, ọlu-unu site-kwa-ra n'ihe-efu: ihe-árú ka onye nārọputa unu bu.


Àkwá ubí ka ha buworo, ọ bu kwa ulo ududo ka ha nātu: onye ahu nke nēri àkwá-ha gānwu, ọzọ, nke anāzọpia gāb͕awaputa aju-ala.


Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.


Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aṅa pu ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? n'ihi na ọnu site n'ihe nke obi nwebigara ókè nēkwu okwu.


Unu agwọ, unu aju-ala, ùnu gēsi aṅa b͕anari ikpé nke ọku ala-mọ?


Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia?


ha gāchilite agwọ, ọ buru kwa na ha aṅua ihe ọ bula nēbute ọnwu, ọ gaghi emeru ha aru ma-ọli; ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike.


Ndi bi n'ebe ahu, bú ndi nāsu asusu ọzọ, we were obi-ọma mezie ayi n'uzọ anāhughi mb͕e ọ bula: n'ihi na ha funwuru ọku, kpọbata ayi nile, n'ihi miri nke nēzo n'oge ahu, na n'ihi oyi.


Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu.


Hà bu ndi nējere Kraist ozi? (anamekwu dika onye anya nādighi nma) mu onwem nēje kari; anamadọb͕ubiga onwem ókè n'ọlu kari, anamanọbiga ókè n'ulo-nkpọrọ kari, anāpiam utari nke-uku ri nne, anọm n'ọnu ọnwu ọtutu mb͕e.


dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan