Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 26:23 - Bible Nso

23 na Kraist-ayi aghaghi ihu ahuhu, na Ọ gaje kwa iburu uzọ kwusara ma ndi-Ju ma ndi mba ọzọ ìhè, site na nbilite-n' ọnwu nke ndi nwuru anwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 na Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye mbụ ga-esi nʼọnwụ bilie, iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ ìhè.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 26:23
29 Iomraidhean Croise  

iro ka M'gētiye kwa n'etiti gi na nwayi ahu, na n'etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n'isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n'ikiri-ukwu.


Mu onwem, bú Jehova, akpọwo gi n'ezi omume, M'gējide kwa aka-gi, chebe gi, nye gi ka i buru ọb͕ub͕a-ndu nke ndim, ka i buru kwa ìhè nke mba nile;


O we si, Ọ bu ihe di kari nfe na i gāburum orù, ime ka ebo nile nke Jekob bilie, na ime ka ndi Israel echebere echebe lata: enyewokwam i ka i buru ìhè nke mba nile, ibu nzọputam rue nsọtu uwa.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Teta, gi mma-agha, imegide Onye-ọzùzù-aturum, na imegide nwoke ahu nke bu ibem, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta): tib͕ue Onye-ọzùzù-aturu ahu, agāb͕asa kwa ìgwè ewu na aturu; M'gēchighari kwa akam imegide ndi ntà.


Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.


ha we si n'ebe anēlì ozu puta mb͕e nbilite-n'ọnwu-Ya gasiri, we ba n'obodo nsọ, were onwe-ha gosi ọtutu madu.


Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel.


Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya?


O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ;


Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam.


Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ:


Ma na O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, ọ dighi na Ọ gaje ilaghachi n'ire-uré ọzọ, O kwuwo otú a, si, M'gēnye unu ihe nile di ọcha nke kwesiri ntukwasi-obi nke ekwere Devid na nkwa.


isaghe anya-ha, ka ha we si n'ọchichiri chigharia ba n'ìhè, si kwa n'ike Setan chigharikute Chineke, ka ha we nara nb͕aghara nmehie nile na ihe-nketa n'etiti ndi edoworo nsọ site n'ikwere na Mu.


Gini mere anātule ya n'ihe anāgaghi-ekwe n'etiti unu, ma ọ buru na Chineke nēme ka ndi nwuru anwu si n'onwu bilie?


Ma ihe nile Chineke buru uzọ kwusa site n'ọnu ndi-amuma-Ya nile, na Kraist-Ya gāhu ahuhu, O mezuru ha otù a.


E, ndi-amuma nile site na Samuel na ndi soro ya n'azu, ka ha ra, bù ndi kwuru, ha kwusa-kwa-ra okwu banyere ubọchi nda.


N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;


ndi chi nke oge a mere ka anya nke uche nke ndi nēkweghi ekwe kpu ìsì n'etiti ha, ka inye-ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraist, Onye bu onyinyo Chineke, we ghara iwakwasi ha.


Ya onwe-ya bu kwa isi aru, nke bu nzukọ-Ya: ebe Ọ bu Onye-nmalite, Onye eburu uzọ mu site na ndi nwuru anwu; ka ewe me ka Ya onwe-ya buru onye mbu n'ihe nile.


N'ihi na o kwesiri Ya, bú Onye ihe nile di n'ihi Ya, Onye ihe nile site-kwa-ra n'aka-Ya di, ebe O kubatarari ọtutu umu-ndikom n'ebube, ka O site n'ahuhu me ka Onye nēdubà ha na nzọputa-ha zue okè.


nke si kwa n'aka Jisus Kraist puta, Onye bu onye-àmà kwesiri ntukwasi-obi, onye eburu uzọ mu n'etiti ndi nwuru anwu, buru kwa onye-isi nke ndi-eze uwa. Onye ahu Nke nāhu ayi n'anya, Onye tọpu-kwa-ra ayi na nmehie nile ayi nime ọbara-Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan