Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 26:22 - Bible Nso

22 Ya mere ebe m'natara iye-aka ahu nke si n'ebe Chineke nọ puta, eguzowom rue ubọchi ta, nāgwasi madu nile ike, ma onye uku, nēkwughi ihe ọ bula kari ihe ndi-amuma na Moses kwuru na ha gaje ime;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma Chineke chebere m mee ka m bụrụ onye dị ndụ taa, ịkọrọ mmadụ niile akụkọ a, ndị ukwu na ndị nta. Ihe m na-ekwu bụkwa ihe ndị amụma na Mosis kwuru na ọ ga-emezu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 26:22
42 Iomraidhean Croise  

Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.


Iye-aka-ayi di n'aha Jehova, Onye meworo elu-igwe na uwa.


Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum.


I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi; Ayi bàra n'ọku na nime miri; I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.


Nwa nke madu nāla, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ bayere Ya: ma ahuhu gādiri nwoke ahu onye anēsite n'aka-ya rara Nwa nke madu nye. Ọ buru na amughi nwoke ahu ọ gādi ya nma.


n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.


O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ.


O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.


O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ;


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef.


Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;


N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ.


Onye ahu ka ndi-amuma nile nāb͕ara àmà, na site n'aha-Ya onye ọ bula nke kwere na Ya gānata nb͕aghara nmehie.


Mb͕e ha mezuru ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ bayere Ya, ha si n'osisi ahu wedata Ya, tọb͕ọ Ya n'ílì.


Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:


nēweputa gi n'aka ndi-Ju, na n'aka ndi mba ọzọ, ndi Mu onwem nēziga gi jekuru ha,


Eguzo-kwa-ram n'ebe a ub͕u a, ebe anēkpem ikpé bayere olile-anya nkwa ahu nke Chineke kwere nna-ayi-hà;


Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.


Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;


N'ihi na enyerem n'aka-unu na mbu ihe m'nata-kwa-ra idebe, na Kraist nwuru n'ihi nmehie-ayi nile, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;


na elì-kwa-ra Ya; na emewo-kwa-ra ka O si n'ọnwu bilie n'ubọchi nke-atọ, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di;


nsob͕um nile, ahuhum nile; aha ihe dakwasirim n'Antiọk, n'Aikọniọm, na Listra; aha nsob͕u m'nagidere: Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile.


Mba nile we we iwe, iwe-Gi we bia, ya na oge ikpe ndi nwuru anwu ikpé, na inye ndi-orù-Gi, bú ndi-amuma, na ndi nsọ, na ndi nātu egwu aha-Gi, ndi ntà na ndi uku, ugwọ-ọlu-ha; na imebi ndi ahu nēmebi uwa.


Ha nābù kwa abù nke Moses, bú orù nke Chineke, na abù nke Nwa-aturu Chineke, si, Ọlu-Gi nile di uku di kwa ebube, Onye-nwe-ayi Chineke, Onye puru ime ihe nile; uzọ-Gi nile ziri ezi, buru kwa ezi-okwu, Gi Eze nke mba nile.


M'we hu ndi nwuru anwu nile, ndi uku na ndi ntà, ka ha nēguzo n'iru oche-eze ahu; ewe saghe akwukwọ di iche iche: asaghe-kwa-ra akwukwọ ọzọ, nke bu akwukwọ nke ndu: ewe kpe ndi nwuru anwu ikpé site n'ihe nile edereri n'akwukwọ ahu di iche iche, dika ọlu nile ha si di.


Samuel we were otù nkume do ya n'etiti Mizpa na Shen, kpọ aha-ya Eben-eza, si, Jehova eyerewo ayi aka rue ub͕u a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan