Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 26:10 - Bible Nso

10 Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Otu a ka m mere na Jerusalem. Ọ bụghị naanị na m natara ikike nʼaka ndịisi nchụaja jiri ya kpọchie ọtụtụ ndị nsọ nʼụlọ mkpọrọ, ewelikwara m aka elu nʼoge a na-ama ha ikpe ọnwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 26:10
17 Iomraidhean Croise  

Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa, Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:


ha we tupu ya n'obodo, tu kwa ya nkume: ndi-àmà we wusa uwe-ha n'ukwu otù nwa-okorọbia anākpọ Sọl.


Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma. Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi.


Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ.


Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà.


Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus.


O rue, mb͕e Pita nējezu n'ebe nile, ọ ridakuru kwa ndi nsọ ndi bi na Lida.


O we nye ya aka-ya, palie ya elu; mb͕e ọ kpọsiri ndi nsọ na ndinyom ndi di-ha nwuru, ọ che ya na ndu n'iru ha.


N'ihi na mu onwem dikarisiri ntà n'etiti ndi-ozi, ebe m'nērughi ka akpọm onye-ozi, n'ihi na esob͕urum nzukọ Chineke.


N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya:


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, nēdegara ndi nsọ ndi nọ n'Efesọs, na ndi kwere na Kraist Jisus, akwukwọ:


M'we hu nwanyi ahu ka ọbara ndi nsọ na ọbara ndi-àmà Jisus nābà ya n'anya dika manya. Mb͕e m'huru ya o we jum anya nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan