Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 26:1 - Bible Nso

1 Agripa we si Pọl, Ekwere ka i kwuere onwe-gi okwu. Mb͕e ahu Pọl setiri aka-ya, we gọpu onwe-ya, si:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Agripa gwara Pọl, “Ị nwere ike i kwuru ọnụ gị.” Mgbe ahụ, Pọl gbasara aka ya abụọ bido ikwu okwu ịgọrọ onwe ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 26:1
12 Iomraidhean Croise  

M'gēkwu kwa okwu bayere ihe-àmà-Gi nile n'iru ndi-eze, Ihere agaghi-emekwam.


N'ihi na akpọwom òkù, unu we ju; Esetipuwom akam, ma ọ dighi onye nāṅa nti;


Onye nāzaghachi okwu tutu ọ nu, Uche b͕agaọrọ ab͕agọ na ọnọdu-ihere ka ọ buru ya.


Onye ezi omume n'anya ndi-ikpe ka onye ahu bu nke buru uzọ kpe ọnu-ya; Ma madu-ibe-ya abia gwuputa ala okwu-ya.


Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.


Ìwu-ayi nēkpe madu ikpé, ọ buru na o bughi uzọ nu n'ọnu-ya, we mara ihe ọ nēme?


Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a.


M'we za ha, si, na ọ bughi ọme-n'ala nke ndi Rom iwere amara rara madu ọ bula nye, ma ọ buru na onye anēbo ebubo ebughi uzọ nwe ndi nēbo ya n'iru ya, hu kwa uzọ igọpu onwe-ya n'ihe eboro ya.


N'ihi na ọ dim ka ọ bu ihe uche nādighi ya, n'iziga onye-nkpọrọ, ka m'ghara igosi kwa ihe eboro ya.


Eze Agripa, agurum onwem n'onye ngọzi diri, na agajem igọpu onwem n'iru gi ta n'ebubo nile ndi-Ju nēbom:


Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:


Ma Ọ nēkwu okwu bayere Israel, si, Ogologo ubọchi dum ka M'b͕asara akam nye ndi nādighi-ekwenye, ndi nēkwugidekwam.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan