Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 22:7 - Bible Nso

7 M'we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsim, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Adara m nʼala ma nụkwa olu gwara m okwu sị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 22:7
15 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Hega, nwayi nējere Serai ozi, òle ebe i siri bia? ọ̀ bu kwa ole ebe i nēje? Ọ si, Ọ bu n'iru Serai, bú nwayi-nwem, ka m'nāb͕apu.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam.


Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam.


Jehova, bú Chineke, we kpọ madu ahu òkù, si ya, Òle ebe i nọ?


Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n'etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam.


otú a ka Jehova siri, Àjọ omume gini ka nna-unu-hà huworo n'arum, na ha esiwo n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu?


N'ihi ya Mu na unu gēkpe kwa ikpe ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), Mu na umu umu-unu gēkpe kwa ikpe.


Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye.


O we si, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Ka akpọgide Ya n'obe.


O we rue, mb͕e m'nāga, nābiaru kwa Damaskọs nso, n'oge di ka etiti-ehihie, na mberede oké ìhè si n'elu-igwe b͕urum àmùmà buruburu.


Mu onwem we za, si, Ì bu onye, Onye-nwe-ayi? O we sim, Mu onwem bu Jisus Onye Nazaret, Onye gi onwe-gi nēsob͕u.


o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?


ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n'ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe;


Jehova we bia, guzo Onwe-ya, kpọ òkù dika Ọ kpọrọ ub͕ò nile, si, Samuel, Samuel. Samuel we si, Kwue; n'ihi na orù-Gi nānu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan