Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 22:5 - Bible Nso

5 Dika onye-isi-nchu-àjà nāb͕a-kwa-ram àmà, ya na nb͕akọ ndi-okenye nile: ndi m'nata-kwa-ra akwukwọ-ozi n'aka-ha inye umu-nne-ayi, m'we ga Damaskọs, idọkputa kwa ndi nọ n'ebe ahu n'ab͕u bia na Jerusalem, ka ewe me ka ha hu ahuhu-nmehie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma dịka onyeisi nchụaja na nzukọ ndị okenye niile pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m nʼaka ha akwụkwọ ozi e deere ụmụnna anyị nọ na Damaskọs. Agara m ebe ahụ ịkpụta ha nʼagbụ bịa Jerusalem maka ịta ha ahụhụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 22:5
21 Iomraidhean Croise  

Mb͕e chi bọrọ, nb͕akọ ndi-okenye nke ndi-Ju zukọrọ, ma ndi-isi-nchu-àjà ma ndi-ode-akwukwọ; ha we duru Ya ga ba na nnọkọ-ikpé-ha, si,


Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),


Umu-nnem, umu eriri Abraham, na ndi di n'etiti unu nātu egwu Chineke, ọ bu ayi onwe-ayi ka eziputara okwu nke nzọputa nka.


Umu-nnam, o ziri ezi iwere nkwuwa-okwu gwa unu okwu bayere nna uku ayi Devid, na ọ nwuru, eli kwa ya, ílì-ya di kwa n'etiti ayi rue ubọchi ta.


Umu-nnem na ndi bu nnam, nurunu ngọpum n'ebe unu nọ ub͕u a.


Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.


Ma mb͕e Pọl matara na otù uzọ nime ha bu ndi-Sadusi, ma uzọ nke-ọzọ bu ndi-Farisi, o tiri nkpu nime nnọkọ-ikpe ahu, si, Umu-nnem, mu onwem bu onye-Farisi, nwa ndi-Farisi: anēkpe mu onwem ikpé bayere olile-anya na nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu.


Nke m'me-kwa-ra na Jerusalem: mu onwem mechibido-kwa-ra ọtutu ndi nsọ n'ulo-nkpọrọ, ebe m'natara ike site n'aka ndi-isi-nchu-àjà, mb͕e eb͕uru ha m'we kweye imegide ha.


Esite-kwa-ram n'ime ka ha hu ahuhu-nmehie ọtutu mb͕e n'ulo-nzukọ nile chọ uzọ ime ka ha kwulu Chineke; ebe anya nādighm nma gabiga ókè megide ha, m'we nēsob͕u ha we rue obodo di iche eche di n'azu ala-ayi.


N'ime ihe ndia mb͕e m'nāga Damaskọs, ebe m'natara ike na nkweye n'aka ndi-isi-nchu-àjà,


O rue, na mb͕e ubọchi atọ gasiri ọ kpọkọrọ ndi bu ndi-isi n'etiti ndi-Ju: mb͕e ha biakọrọ n'otù, ọ si ha, Umu-nnem, mu onwem, ọ bu ezie na emeghm ihe ọ bula megide ndi-Ju, ma-ọbu ọme-n'ala nke nna-ayi-hà, ma esi na Jerusalem raram nye n'aka ndi Rom ka m'buru onye-nkpọrọ:


Ha we si ya, Ayi onwe-ayi anataghi akwukwọ-ozi site na Judia bayere gi, ọ dighi kwa onye ọ bula n'etiti umu-nne-ayi ruru ebe a, we kọ akukọ ma-ọbu kwue ajọ ihe ọ bula bayere gi.


Ma ub͕u a, umu-nnam, amataram na unu mere ya n'amaghi-ihe, dika ndi-isi-unu me-kwa-ra.


O we rue n'echi-ya, na ndi-isi-ha na ndi-okenye-ha na ndi-ode-akwukwọ-ha zukọrọ na Jerusalem;


Ma mb͕e ha nuru nka, ha ba n'ulo uku Chineke mb͕e chi nābọ, we nēzí ihe. Ma onye-isi-nchu-àjà biara, ya na ndi soro ya, we kpọkọ nnọkọ-ikpé-ha, na nzukọ ndi-okenye umu Israel nile, we ziga n'ulo-nkpọrọ, ka ekuta ha.


n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u.


N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya:


n'akuku inu-ọku-n'obi, anamesob͕uri nzukọ Kraist; n'akuku ezi omume nke di nime iwu, ahuru na adighi m ita uta.


Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan