Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 22:12 - Bible Nso

12 Otù onye, bú Ananaias, nwoke nke nātu egwu Chineke dika iwu-ayi si di, onye ndi-Ju nile bi n'ebe ahu b͕ara ezi àmà,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Nʼebe ahụ ka Ananayas bi, bụ onye anyị pụrụ ịgụ nʼonye ezi omume nʼihi idebe iwu. O nwekwara ọgbụgba ama dị mma site nʼọnụ ndị Juu bi nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 22:12
10 Iomraidhean Croise  

Ma le, otù nwoke nọ na Jerusalem, onye aha-ya bu Simeon; nwoke a bu kwa onye ezi omume na onye nātu egwu Chineke, nēche nkasi-obi nke Israel: Mọ Nsọ di kwa n'aru ya.


Ha we si, Kọniliọs ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nwoke bu onye ezi omume nke nātu kwa egwu Chineke, onye mba ndi-Ju dum nāb͕a-kwa-ra ya ezi àmà, ya ka mọ-ozi nke di nsọ duru ọdú site na Chineke, ikpọta gi n'ulo-ya, na inu okwu ufọdu si gi n'ọnu puta.


Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha.


Kama, umu-nna-ayi, chọputanu n'etiti unu ndikom asa ndi ab͕ara ha ezi àmà, ndi juputara na Mọ Nsọ na amam-ihe, ndi ayi gēme ndi-isi n'ọlu a di nkpà.


Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá.


site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;


Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu.


N'ihi na nime okwukwe ahu ka ab͕ara ndi okenye àmà.


Madu nile, ha na ezi-okwu onwe-ya, ab͕aworo Dimitriọs àmà: e, ayi onwe-ya nāb͕a kwa àmà; i mata-kwa-ra na àmà-ayi bu ezie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan