Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 21:8 - Bible Nso

8 Echi-ya ayi we pua, je rue Sisaria: ayi we ba n'ulo Filip onye nēzisa ozi ọma, nke bu otù nime ndikom asa ahu, ayi na ya we nọgide.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị gara nʼihu nʼije anyị rute Sizaria. Nʼebe ahụ, anyị nọnyeere otu nwanna anyị a na-akpọ Filip onye na-agbasa oziọma. Ọ bụ otu nʼime mmadụ asaa ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 21:8
18 Iomraidhean Croise  

Ma otù nwoke nọ na Sisaria, aha-ya bu Kọniliọs, ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise nke òtù ndi-agha ahu anākpọ òtù Itali,


Mb͕e ọ husiri ọhù ahu, ngwa ngwa ayi we chọ uzọ ipu ka ayi ba na Masedọnia, ebe ayi sikwutara n'obi-ayi na Chineke kpọrọ ayi-ri izì ha ozi ọma.


N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.


O we rue, mb͕e ayi nāga ebe ekpere, na otù nwa-ab͕ọghọ onye nwere mọ nke anākpọ Paiton zutere ayi, onye nēwetara ndi-nwe-ya ọtutu urù site n'ibu amuma ugha.


Mb͕e ọ puru n'ub͕ọ na Sisaria, ọ rigo kele nzukọ Kraist, we ridata n'Antiọk.


Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi buru uzọ je ub͕ọ, ayi nupuru ub͕ọ ahu ije Asọs, n'ihi na ayi zubere iwere Pọl n'ub͕ọ n'ebe ahu: n'ihi na otú a ka ọ karari, ebe o zubere na ya onwe-ya gāga n'ukwu-ala.


Ayi onwe-ayi we si na Filipai ba n'ub͕ọ je, mb͕e ubọchi achicha ekoghi-eko gasiri, ayi we biakute ha na Troas ka o ruru ubọchi ise; ebe ayi nọgidere ubọchi asa.


Ufọdu nime ndi nēso uzọ Jisus si na Sisaria so kwa ayi je, nēkuru otù Neson onye Saiprọs, onye sitere na mbu nēso uzọ Jisus, onye ayi gānọ n'ulo-ya dika ndi-ọbìa.


O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali:


Mb͕e ekpebìri na ayi gābà n'ub͕ọ je Itali, ha we rara Pọl na ufọdu ndi-nkpọrọ ọzọ nye n'aka ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, aha-ya bu Juliọs, nke òtù ndi-agha Ọgustọs.


Mb͕e ọnwa atọ gasiri ayi we ba n'ub͕ọ Aleksandria nupu, bú ub͕ọ nke nọgidereri n'agwe-etiti ahu na mb͕e oyi, nke ihe-iriba-ama-ya bu, Umu-nne-ndikom abua amuru n'otù mb͕e.


Mb͕e ayi batara nime Rom, ewe kwe ka Pọl nọgide iche, ya na onye-agha nke nēche ya.


Okwu ahu we tọ ọra ha nile utọ: ha we rọputa Stifen, bú nwoke nke juputara n'okwukwe na Mọ Nsọ, ya na Filip, na Prọkọrọs, na Naikanoa, na Taimon, na Pamenas, na Nikọlas, bú onye Antiọk nke nēso uzọ ndi-Ju:


Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs.


Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;


Ma gi onwe-gi, nēnwe anya-udo n'ihe nile, huju anya, lua ọlu nke onye nēzisa ozi ọma, jezu ozi-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan