Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 20:3 - Bible Nso

3 Mb͕e ọ nọsiri ọnwa atọ n'ebe ahu, mb͕e ndi-Ju b͕a-kwa-ra ajọ ìzù megide ya, mb͕e ọ gaje inupu ub͕ọ ije Siria, o zubere isi uzọ Masedọnia laghachi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ọ nọrọ ọnwa atọ nʼebe ahụ. Mgbe ọ chọpụtara na ndị Juu agbaala ajọ izu megide ya dịka ọ na-ejikere iso ụgbọ mmiri gaa Siria, o kpebiri ka ya si ụzọ Masidonia laghachi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 20:3
19 Iomraidhean Croise  

Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.


Ọ buru na ha asi, Soro ayi je, Ka ayi che anwu ọbara, Ka ayi zobe onwe-ayi ijide onye nēmeghi ihe ọjọ n'efu;


N'ihi na ahuwo ndi nēmebi iwu n'etiti ndim: ha nēle anya buruburu, dika ndi-osi-ọnyà si eche anwu; ha esiwo ọnyà, ọ bu madu ka ha nānwude.


Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.


ayi we site n'ebe ahu ga rue Filipai, nke bu otù obodo nke Masedọnia, obodo mbu nke akuku ahu, buru kwa colony nke Rom: ayi we nānọgide n'obodo ahu ubọchi ufọdu.


Ewe me ka Pọl hu ọhù n'abali: Otù nwoke, bú onye Masedọnia, nēguzo, nāriọ ya, si, Gabita na Masedọnia, yere ayi aka.


Mb͕e Pọl nọgidesiri ọtutu ubọchi ọzọ, ọ kele umu-nna nime Kraist ekele ikpe-azu, we si n'ebe ahu ba n'ub͕ọ ije Siria, Prisila na Akwila soro kwa ya; mb͕e ọ kpachasiri agiri-isi-ya na Kenkrei: n'ihi na ọ kwereri Chineke nkwa.


Ma mb͕e ihe ndia mezuru, Pọl zubere na mọ-ya iga Jerusalem, mb͕e ọ gāgabigasi nime Masedọnia na Akaia, si, Mb͕e m'rusiri ebe ahu, aghaghm ihu kwa Rom.


Ma mb͕e ùzù ahu tubìri, mb͕e Pọl kpọtasiri ndi nēso uzọ Jisus, kasi kwa ha obi, o kele ha ekele ikpe-azu we pua iga ba na Masedọnia.


otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:


Mb͕e ọ gabigasiri n'akuku ahu nile, were kwa ọtutu okwu kasie ha obi, ọ bia na Gris.


Mb͕e ayi hugasiri Saiprọs anya, rapu kwa ya n'aka-ekpe, ayi we ga Siria, we pua n'ub͕ọ na Taia: n'ihi na ebe ahu ka ub͕ọ gaje ikwapu ihe di ya.


nāchọ amara imegide ha, ka ọ kpọta ya na Jerusalem; ebe ha nēche anwu ib͕u ya n'uzọ.


Nime ntukwasi-obi a ka m'zube-kwa-ra na mbu ibiakute unu, ka unu we nwe amara nke-abua;


n'ije ọtutu mb͕e, n'ize-ndu site n'osimiri, n'ize-ndu site na ndi nāpunara madu ihe, n'ize-ndu site na ndi mba nkem, n'ize-ndu site na ndi mba ọzọ, n'ize-ndu nime obodo, n'ize-ndu nime ọhia, n'ize-ndu nime oké osimiri, n'ize-ndu n'etiti umu-nna ugha;


N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.


Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan