Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 2:9 - Bible Nso

9 Ndi Patia na ndi Midia na ndi Ilam, na ndi bi na Mesọ-pọtemia, ndi bi kwa nime Judia na Kapa-dọsia, nime Pọntọs na Esia,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ndị Patia, na ndị Midia, na ndị Elam, ndị bikwa nʼime Mesopotamịa, ndị Judịa, na ndị Kapadosia, ndị Pọntọs, na ndị Eshịa,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 2:9
34 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.


O rue, n'ubọchi nke Amrafel, bú eze Shaina, na nke Ariok, bú eze Elasa, na nke Kedoalaoma, bú eze Ilam, na nke Taidal, bú eze Goyim,


Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.


N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.


Ewe chọta akwukwọ-npiakọta n'Ekbatar, n'ulo uku nke di n'ala anāchi achi, bú Midia, ma ihe-ncheta di nime ya nke edeworo otú a.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na Onye-nwe-ayi gēseti kwa aka-Ya ọzọ nke ub͕ò abua inweta ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria, site kwa n'Ijipt, site kwa na Patros, site kwa na Kush, site kwa n'Ilam, site kwa na Shaina, site kwa na Hemat, site kwa n'agwe-etiti nile nke oké osimiri.


Ọhù siri ike ka egosiworom; onye-nghọb͕u nāghọb͕u, onye nāpunara madu ihe nāpunara madu ihe. Rigo, gi Ilam; nọchigide n'agha, gi Midia; ize-ume-ya nile ka M'meworo ka ọ kwusi.


PERES; ekewawo ala-eze-gi, nye ndi Midia na ndi Peasia.


M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.


Ebulu ahu nke i huru, nke nwere mpi abua, ha bu eze nke Midia na Peasia.


Ha we nāgabiga n'ala Frijia na Galetia, ebe Mọ Nsọ b͕ochiri ha ikwu okwu Chineke n'Esia;


O we hu otù onye-Ju, aha-ya bu Akwila, onye Pọntọs n'ọmumu-ya, onye siworori n'Itali bia ọhu, ya na nwunye-ya Prisila, n'ihi na Klọdiọs nyereri iwu ka ndi-Ju nile si na Rom pua: o we biakute ha;


Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.


ọ bughi kwa nání na ihe-ize-ndu di na agēlelì ọlu-ayi nka; kama na agāgu kwa ulo nke oké chi-nwanyi ahu, bú Daiana, n'ihe-efu, na agaje kwa isi n'idi-uku-ya weda ya n'ala, onye Esia dum na elu-uwa dum madu bi nāsọpuru.


Ufọdu kwa n'etiti ndi-isi Esia, ebe ha bu ndi-eyì-ya, ha zigara ya ozi, we riọ ya ka ọ ghara inuye onwe-ya nime ebe ahu anēkiri ihe.


Àyi onwe-ayi si kwa aṅa nu n'otù n'asusu nke aka ayi, nke amuru ayi nime ya?


N'ihi na Pọl zubereri igabiga Efesọs n'ub͕ọ, ka aghara ime ya ka ọ nọgide ogologo oge n'Esia; n'ihi na ọ nēme ngwa iru Jerusalem mb͕e ubọchi Pentikọst akērughi, ma ọ buru na ọ puru ime ya.


Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha, Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile,


Sopata, nwa Pirọs, onye Beria, we so ya; ya na Aristakọs na Sekundọs, nime ndi Tesalọnaika; na Gaiọs nke Dabe, na Timọti, na Tikikọs na Trọfimọs, bú ndi Esia.


Ma mb͕e ubọchi asa ahu gaje izu, ndi-Ju ndi si n'Esia bia, mb͕e ha huru ya n'ulo uku Chineke, ha me ka ìgwè madu ahu nile b͕a aghara, ha we dakwasi ya aka,


mb͕e m'nēme ihe ndia ha hurum n'ulo uku Chineke mb͕e m'mesiri onwem ka m'di ọcha, mu na ìgwè madu ma-ọbu itu-ùzù adigh: ma ndi-Ju ufọdu ndi si n'Esia bia


Ayi we ba n'ub͕ọ Adramitiọm, nke gaje iga ebe di n'usọ oké osimiri nke Esia, we nupu, Aristakọs, onye Masedọnia nke Tesalọnaika, soro kwa ayi.


Ma ufọdu biliri n'etiti ndi sitere n'ulo-nzukọ nke anākpọ ulo-nzukọ nke ndi-Libatin, na nke ndi Sairini, na nke ndi Aleksandria, na nke ndi sitere na Silisia na Esia, ha na Stifen nājurita onwe-ha ajuju.


O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,


kele-kwa-nu nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha. Kelenu Epinetọs onye m'huru n'anya, onye bu nkpuru mbu nke Esia nye Kraist.


Nzukọ Kraist nile nke di n'Esia nēkele unu. Akwila na Priska nēkele unu ọtutu ekele nime Onye-nwe-ayi, ha na nzukọ Kraist nke di n'ulo-ha.


N'ihi na, umu-nnam, ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere nkpab͕u-ayi nke akpab͕uru ayi n'Esia, na esob͕uru ayi nke-uku ri nne, kari ike-ayi, ya mere ayi nwebigara obi abua ókè ma ayi gādi kwa ndu:


n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru unu n'uzọ, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na n'ihi na ha gotara Belam nwa Beoa imegide gi site na Petoa nke Mesọpọtemia, ikọcha gi.


I matara nka, na ndi nile di n'Esia b͕akutaram azu; ndi Faigelọs na Hamọgenis di n'etiti ha.


Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,


ka ọ nāsi, Ihe i nele anya, de ya n'akwukwọ, ziga-kwa-ra nzukọ Kraist asa ndia; zigara Efesọs, ziga-kwa-ra Smuana, ziga-kwa-ra Pagamọm, ziga-kwa-ra Taiataira, ziga-kwa-ra Sadis, ziga-kwa-ra Filadelfia, ziga-kwa-ra Leọdisia.


Jọn nēdegara nzukọ Kraist asa nke di n'Esia akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo, nke si n'aka Onye ahu puta, bú Onye nādi adi, Onye dikwari, Onye nābia kwa; nke si kwa n'aka Mọ asa ahu puta, bú ndi nọ n'iru oche-eze-Ya;


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O we renye ha n'aka Kushan-rishataim, bú eze Mesọpọtemia; umu Israel we fè Kushan-rishataim òfùfè arọ asatọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan