Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 2:30 - Bible Nso

30 Ya mere ebe ọ bu onye-amuma, mata kwa na Chineke ṅuru ya-ri iyi, na Ọ gēwere otù Onye nime ndi bu nkpuru si ya n'afọ puta me ka Ọ nọkwasi oche-eze-ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ma ọ bụ onye amụma marakwa na Chineke jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa na otu nʼime ụmụ ya ga-anọkwasị nʼocheeze ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 2:30
37 Iomraidhean Croise  

Mọ nke Jehova kwuru site n'ọnum, Okwu-Ya di kwa n'irem.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


ma ha gēfè Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha, onye M'gēme ka o biliere ha.


Ma gi onwe-gi, Bet-lehem Efrata, nke di ntà idi n'etiti usu nile nke nnù abua na ọgu iri nke Juda, nime gi ka otù onye gēsi putaram ibu onye nāchi achi n'Israel; onye ọpupu-ya nile sitere na mb͕e ochie, site n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Ọ si ha, Dèvid si kwa aṅa kpọ Ya Onye-nwe-ya nime Mọ Nsọ, si,


Mb͕e ha kpọgidesiri Ya n'obe, ha kère uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà: ka o wee mezuo bụ ihe si n'ọnụ onye amụma Pita, Ha nēkere onwe-ha uwem, n'elu bụ ihe m n'eyi n'aru ka ha nēfe kwa nza.


Devid onwe-ya siri nime Mọ Nsọ, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.


O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem.


Umu-nnam, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ aghaghi imezu, nke Mọ Nsọ kwuru n'oge gara aga site n'ọnu Devid banyere Judas, onye mesiri buru onye-ndù ndi jidere Jisus.


bayere Okpara-Ya, Onye amuru site na nkpuru Devid dika anu-aru si di,


Ọzọ kwa, Aisaia si, Nkpọrọgwu ahu nke Jesi gādi, Na onye ahu Nke nēbili ibu onye-isi mba nile; Onye ahu ka ndi mba ọzọ gēle anya Ya.


Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di:


Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,


N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,


O we kà otù ubọchi ọzọ, nēkwu nime Devid, mb͕e ogologo oge di otú a gasiri, si, Ta, dika ebuworo uzọ kwue, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike.


N'otù uzọ ahu Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na izù-Ya bu ihe nādighi-agha agha, O were iṅu-iyí b͕o okwu:


(n'ihi na ọ bu ezie na emewo ha ka ha buru ndi-nchu-àjà nāṅughi iyi; ma emewo Ya onye-ya n'iṅu iyi site n'aka Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Ya, si, Onye-nwe-ayi ṅuru iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi);


N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan