Jehova we si, Le, ha bu otù ndi, ọ bu kwa otù asusu ka ha nile nwere; nka bu kwa ihe ha nāmalite ime: ub͕u a agaghi-eb͕ochiri ha ihe ọ bula nke ha nēzube ime.
M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.
Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism:
nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:
Ire bu kwa ọku, bú uwa ahu nke ajọ omume: ire nēguzo n'etiti ihe nile di ayi n'aru dika ihe nēnye aru dum ntupọ, nke nāfunwu kwa ihe nāga dika amuru ya ọku, ọku ala-mọ bu kwa ihe nāfunwu ire ahu ọku.
M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;