Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 2:17 - Bible Nso

17 Ọ gēru kwa na mb͕e ikpe-azu, ka Chineke kwuru, M'gāwusa ufọdu nime Mọm n'aru anu-aru nile, bú madu: Umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom gēbu kwa amuma, Umu-okorọbia-unu gāhu kwa ọhù, Ndi-okenye-unu gārọ kwa nrọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “ ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ, ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 2:17
38 Iomraidhean Croise  

Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.


Gi Onye nānu ekpere, Gi ka anu-aru nile, bú madu, gābiakute.


Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n'ọzara asuru asu: Dika oké miri-ozuzo nke nēdè ala.


Laghachinu n'iba-nbam: Le, m'gāwupuru unu mọm, M'gēme ka unu mara okwum nile.


O gēru kwa n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ya elu kari ugwu ntà nile; mba nile gērùbà nime ya dika osimiri.


agēkpughe kwa ebube Jehova, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n'otù: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.


N'ihi na M'gāwukwasi miri n'aru onye akpiri nākpọ nku, na ọtutu miri-iyi n'ala-akọrọ: M'gāwukwasi Mọm n'aru nkpuru-gi, na ngọzim n'aru umu i muru:


M'gēme kwa ka ndi nēme gi ihe-ike rie anu-aru onwe-ha: ha gāṅubiga kwa ọbara onwe-ha ókè, dika ọ bu manya-vine ọhu: anu-aru nile, bú madu, ewe mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi, na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


Ọ gēru kwa, na site n'otù ọnwa ọhu rue ọnwa ọhu ọzọ, na site n'otù ubọchi-izu-ike rue ubọchi-izu-ike ọzọ, anu-aru nile, bú madu, gābia ikpọ isi ala n'irum, ka Jehova siri.


M'gēnye kwa ha otù obi, ọ bu kwa mọ ọhu ka M'gētiye nime unu; M'gēwezuga kwa obi nkume n'anu-aru-ha, nye ha obi anu-aru:


M'gaghi-ezonari kwa ha irum ọzọ: n'ihi na awukwasiwom Mọm n'ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.


emesia umu Israel gālata, chọ Jehova, bú Chineke-ha, na Devid, bú eze-ha; ha gēji kwa oké egwu biakute Jehova, biaru kwa idi-nma-Ya na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.


Ọ gēru kwa, n'ikpe-azu nke ubọchi ndia, na ugwu nke ulo Jehova ganēguzosi ike n'elu ugwu nile, agēbuli kwa ugwu ahu elu kari ugwu ntà nile; ndi di iche iche gērùbà nime ya dika osimiri.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


Dere du, unu anu-aru nile, n'iru Jehova: n'ihi na O siwo n'ebe-obibi-Ya di nsọ teta.


Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.


dika I nyere Ya ike n'ebe madu nile nọ, ka ihe ọ bula I nyeworo Ya, ka O we nye ha ndu ebighi-ebi.


Ma nka ka O kwuru bayere Mọ Nsọ, Nke ndi kwere na Ya gaje inara: n'ihi na akēnyeghi Mọ Nsọ; n'ihi na akēnyeghi Jisus otuto.


Ibobo we nwua ha n'aru, bú ndi kwere na Jisus ndi sitere na ndi obibì-úgwù, ka ha ra, bú ndi soro Pita bia, n'ihi na awusawo-kwa-ra onyinye nke bu Mọ Nsọ n'isi ndi mba ọzọ.


Ma na mb͕e ahu ndi-amuma ufọdu siri na Jerusalem ridata n'Antiọk.


Ma otù onye nime ha, aha-ya bu Agabọs, biliri, we gosi site na Mọ Nsọ na oké unwu gaje ida n'elu-uwa dum madu bi: nke putara n'oge Klọdiọs.


kama nka bu nke ekwuworo site n'ọnu Joel onye-amuma, si,


E, n'aru ndi-orùm ndikom na n'aru ndi-orùm ndinyom Ka M'gāwusa ufọdu nime Mọ nkem na mb͕e ahu; ha gēbu kwa amuma.


Ya mere, ebe eweliri Ya elu site n'aka-nri Chineke, ebe Ọ nata-kwa-ra n'aka Nna-Ya nkwà ahu, bú Mọ Nsọ, Ọ wusara nka unu onwe-unu nāhu nānu kwa.


Ma onye a nwere umu-nwanyi anọ, ndi nāmaghi nwoke, ndi nēbu amuma.


Olile-anya ahu emeghi kwa ka ihere me ayi; n'ihi na awusaworo ihu-n'anya nke Chineke n'obi-ayi site n'aka Mọ Nsọ Nke enyere ayi.


nye kwa onye ọzọ nluputa nke ọlu di ike; nye kwa onye ọzọ obubu-amuma; nye kwa onye ọzọ itule mọ di iche iche; nye kwa ibe-ya aha asusu di iche iche; nye kwa onye ọzọ isughari asusu:


Chineke debe-kwa-ra ufọdu nime nzukọ-Ya, nke-mbu ndi-ozi, nke-abua ndi-amuma, nke-atọ ndi-ozizí, nke so ha ọlu di ike, nke so ha onyinye-amara di iche iche ime ka aru madu di ike, iye-aka, ichi-isi, aha asusu di iche iche.


Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;


Ọla-edo-unu na ọla-ọcha-unu ab͕awo nchara; nchara-ha gāburu kwa unu ihe-àmà, ọ gēripia kwa anu-aru-unu dika ọku. Unu kpadoro àkù-unu na mb͕e ikpe-azu.


ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan