Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 2:14 - Bible Nso

14 Ma Pita guzoro, ya na ndi-ozi iri na otù ahu, we welie olu-ya elu, gwawa ha okwu, si, Ndikom nke Judia, na unu nile ndi bi na Jerusalem, maranu nka, ge-kwa-nu nti n'okwum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Pita guzoro, ya na ndị ozi iri na otu ahụ welie olu gwa ọgbakọ ahụ okwu, “Ndị Juu na unu ndị bi na Jerusalem, matanụ nke a, geekwanụ ntị na ihe m na-ekwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 2:14
18 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.


Rigo n'elu ugwu di elu, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Zaion; welie olu-gi n'ike, gi nwanyi nēzisa ozi ọma, bú Jerusalem; welie ya, atula egwu; si obodo nile nke Juda, Le, Chineke-unu!


Genum nti, unu ndi nāb͕aso ezi omume, ndi nāchọ Jehova: legidenu oké nkume anya nke esiri waputa unu, legide-kwa-nu ọnu olùlù nke esiri gwuputa unu.


Ṅanum nti, unu ndim; unu kwa mba nkem, gēnum nti: n'ihi na otù iwu gēsi n'ọnum puta, M'gēme kwa ka ikpém nwe ọnọdu ka ọ buru ìhè nke ndi nile.


Genum nti, unu ndi mara ezi omume, bú ndi ahu nke iwum di n'obi-ha; unu atula egwu ita-uta madu, unu atu-kwa-la ujọ nkwulu nile ha.


Nuru olu ndi-nche-gi! ha eweliwo olu-ha, n'otù ka ha nētikọ nkpu ọṅù; n'ihi na anya na anya ka ha gāhu mb͕e Jehova nālaghachikute Zaion.


N'ìhi gini ka unu nātù ego inye n'ọnọdu ihe nābughi nri? nà ihe putara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọnọdu ihe nke nādighi-eju afọ? genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ.


Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem,


Ha we fere ha nzà; nzà ahu we ma Mataias; ewe gua ya nime ndi-ozi iri na otù ahu.


Pọl we bilie, kpukpu kwa aka, si, Ndikom nke Israel, na ndi nātu egwu Chineke, nurunu.


Ndikom nke Israel, nurunu okwu ndia: Jisus Onye Nazaret, bú Nwoke Nke Chineke gosiworo unu site n'ọlu di ike na ọlu-ebube na ihe-iriba-ama, nke Chineke mere site n'aka-Ya n'etiti unu, dika unu onwe-unu matara:


nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.


O we si ha, Ndikom nke Israel, nēzenu onwe-unu n'ihe banyere madu ndi a, ihe unu gaje ime.


O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,


Moses na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, we gwa Israel nile okwu, si, Nọdu du, ge kwa nti, Israel; ubọchi ta ka i ghọworo Jehova, bú Chinek-gi, otù ndi.


Nurunu, umu-nnam ndi m'huru n'anya; Chìneke arọputaghi ndi bu ob͕eye n'ihe nke uwa ka ha buru ndi-ọgaranya n'okwukwe, buru kwa ndi-nketa nke ala-eze ahu nke O kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan