Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura.
Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.
Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēb͕ochi ha; ha gēripia kwa, zọda nkume èbè nile; ha gāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, me nkpọtu dika site na manya-vine: ha gējuputa kwa dika ọkwa-nwusa, dika nkuku nile nke ebe-ichu-àjà.
N'ihi na le ka idi-nma-Ya si di uku! le kwa ka ima-nma-Ya si di uku! ọka gemeka umu-okorọbia tozue okè nke-ọma, manya-vine ọhu kwa umu-ab͕ọghọ nke nāmaghi nwoke.
Ya mere asi na nzukọ Kraist dum biakọrọ n'otù ebe, asi kwa na ha nile ji asusu di iche iche nēkwu okwu, ma ọ buru na ndi nāmutaghi akwukwọ ma-ọbu ndi nēkweghi ekwe gābata, hà agaghi-asi na anya adighi unu nma?