Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 19:8 - Bible Nso

8 O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ banyere nʼụlọ nzukọ ahụ ma were nkwuwa okwu, na ịrụ ụka nʼebe o doro anya gwasie ha okwu ike banyere alaeze Chineke. Ọ bụ ọnwa atọ ka o were ya ime nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 19:8
17 Iomraidhean Croise  

ndi O ji kwa ọtutu uzọ nādighi igọ agọ che Onwe-ya n'iru ha na ndu mb͕e Ọ husiri ahuhu, ebe O mere ka ha nāhu Ya anya n'ogologo ọgu ubọchi abua, O nēkwu kwa ihe nile bayere ala-eze Chineke:


Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.


Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.


O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus.


Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.


Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu.


onye ahu we malite ikwuwa okwu n'ulo-nzukọ. Ma mb͕e Prisila na Akwila nuru okwu-ya, ha kutara ya n'ebe ha nọ, we kọrọ ya uzọ Chineke nke-ọma kari.


O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.


Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.


Ha nile ra ka ndikom iri na abua.


Ma mb͕e obi madu ufọdu mere etili, mb͕e ha ghara kwa ikweye, nēkwu ihe ọjọ bayere Uzọ Jisus n'iru ọra madu, o we si n'ebe ha nọ pua, kewapu ndi nēso ụzọ Jisus, nēkwu okwu kwa-ubọchi n'ulo-akwukwọ Tiranọs.


N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.


Mb͕e ha kasiri ya otù ubọchi àkà, ọtutu madu kariri we biakute ya n'ebe ọ nọ dika ọbìa; ndi ọ kọrọ akukọ, nēkwusi okwu ala-eze Chineke ike, nēme kwa ka ha kweye n'ihe bayere Jisus, site n'iwu Moses, site kwa na ndi-amuma, si n'ututu rue anyasi.


Ndi m'huru n'anya, ebe m'nānu ọku nile n'obi idegara unu akwukwọ bayere nzọputa ahu azọputakọrọ ayi, ọ dim nkpà idegara unu akwukwọ nāriọ unu ka unu nāb͕asi nb͕a ike n'ihi okwukwe ahu nke enyere ndi nsọ n'aka nání otù mb͕e idebe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan