Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 18:8 - Bible Nso

8 Krispọs, onye-isi ulo-nzukọ, we kwere n'Onye-nwe-ayi, ya na èzí-na-ulo-ya dum; ọtutu madu n'etiti ndi Kọrint we kwere mb͕e ha nuru, ewe me ha baptism.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Krispọs onyeisi nʼụlọ nzukọ ahụ na ezinaụlọ ya niile kweere nʼOnyenwe anyị. Ọtụtụ ndị ọzọ bi na Kọrint nụrụ okwu ahụ, kwere, e mee ha baptizim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 18:8
25 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n'ulo, na ndi eji ego b͕ata n'aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.


N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:


Otù nime ndi-isi ulo-nzukọ, aha-ya bu Jeairọs, we bia; mb͕e ọ huru Ya, o we da n'ala n'ukwu-Ya,


Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, ha si n'ulo onye-isi ulo-nzukọ ahu bia, si, Nwa-gi nwanyi anwuruwo: gini mere i nēsob͕u Onye-ozizí a ọzọ kwa?


onye nāsọpuru Chineke, onye ya na èzí-na-ulo-ya nile nātu kwa egwu Chineke, onye nālu ọtutu ọlu ebere nye ndi-Ju, nēkpe-kwa-ra Chineke ekpere mb͕e nile.


onye gāgwa gi okwu ufọdu, nke agēji zọputa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo-gi nile.


Ma mb͕e agusiri akwukwọ iwu na ndi-amuma, ndi-isi ulo-nzukọ ahu zigara ha ozi, si, Umu-nne-ayi, ọ buru na unu nwere okwu nkasi-obi igwa ndi-ayi, kwuenu.


O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.


Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint.


Ha nile we jide Sostenis, bú onye-isi ulo-nzukọ, tie ya ihe n'iru oche-ikpé ahu. Ọ dighi kwa ihe ọ bula n'ihe ndia meturu Galio n'obi.


O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:


Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom.


nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, bú ndi edoworo nsọ nime Kraist Jisus, ndi akpọrọ ibu ndi nsọ, ha na ndi nile nākpọku aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist n'ebe nile, bú Onye-nwe ayi na ha:


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ Chineke, na Timọti nwa-nna-ayi, nēdegara nzukọ Chineke nke di na Kọrint akwukwọ, ha na ndi nsọ nile ndi nọ n'Akaia dum:


Ma mu onwem nākpọku Chineke ka Ọ buru onye-àmà megide nkpuru-obim, na ọ bu n'imere unu ebere ka m'nējighi bia Kọrint rue ub͕u a.


Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.


Erastọs nọgidere na Kọrint: ma arapurum Trọfimọs nime Militọs, aru adighi ya ike.


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan