Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 17:4 - Bible Nso

4 Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ụfọdụ nʼime ndị Juu ahụ ka e mere ka ha kwere ma sonyere Pọl na Saịlas, otu aka ahụ, igwe mmadụ ndị na-atụ egwu Chineke nʼetiti ndị Griik na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 17:4
31 Iomraidhean Croise  

Nējeso ndi mara ihe, i gāma kwa ihe: Ma eyì ndi-nzuzu ka agēmejọ.


Rapunu amaghi-ihe, unu ndi nēnweghi uche, we di ndu; Ga-kwa-nu n'iru n'uzọ nghọta.


Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ jeworo, Gi onye mara nma n'etiti ndinyom? Òle ebe onye ihe-ya nātọ gi utọ cheworo iru, Ka ayi we soro gi chọ ya?


Ọtutu mba gārapa-kwa-ra na Jehova n'ubọchi ahu, ghọ-kwa-ram otù ndi: M'gēbi kwa n'etiti gi, i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute gi.


Ya mere ndi-Ju siritara onwe-ha, Òle ebe Onye a gaje iga na ayi onwe-ayi agaghi-achọta Ya? Ọ̀ gaje igakuru ndi b͕asara n'etiti ndi-Grik na izí ndi-Grik ihe?


Ma mb͕e nzukọ ahu lasasiri, ọtutu madu n'etiti ndi-Ju, na n'etiti ndi nēso uzọ ndi-Ju ndi nātu egwu Chineke, soro Pọl na Banabas: ndi nāgwa ha okwu, nēme kwa ha ka ha kweye inọgide n'amara nke Chineke.


Ma ndi-Ju kwaliri ndinyom nātu egwu Chineke, bú ndi anāsọpuru, na ndi-isi obodo ahu, ha we kpalie nsob͕u megide Pọl na Banabas, we chupu ha n'ókè-ala-ha.


O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus.


Ma ọra obodo ahu kewara: ufọdu we nọ n'akuku ndi-Ju, ufọdu nọ kwa n'akuku ndi-ozi Jisus.


Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:


Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu.


Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.


ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n'amara Onye-nwe-ayi.


Nwoke a ka Pọl chọrọ ka o so ya pua; o we were ya bì ya úgwù n'ihi ndi-Ju ndi nọ n'ebe ahu: n'ihi na ha nile matara na nna-ya bu onye-Grik.


Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju.


Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom.


Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu.


Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.


Ma ndikom ufọdu rapara n'aru-ya, we kwere na Jisus: n'etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.


O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.


Ewe nēme nka ogologo arọ abua; ya mere ndi nile ndi bi n'Esia nuru okwu Onye-nwe-ayi, ma ndi-Ju ma ndi-Grik.


Ndi nile ndi kwere na Kraist nọkọ-kwa-ra, ha nwekọ-kwa-ra ihe nile;


nēti nkpu, si, Ndikom Israel, yere ayi aka: Nka bu nwoke ahu, onye nēzí madu nile n'ebe nile ihe megide ndi-Ju, na iwu-ayi, na ebe nka: tukwasi ya o dubata-kwa-ra ndi-Grik n'ulo uku Chineke, o meruwo kwa ebe nsọ a.


Ufọdu we kwere ihe nile ekwuru, ma ufọdu ekweghi.


Ma mb͕e arapusiri ha, ha biakutere ndi nke aka ha, we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye siri ha-ri.


ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n'ọchichọ Chineke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan