Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 17:16 - Bible Nso

16 Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 17:16
20 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya.


Anya-miri nke di ka ọtutu miri-iyi nāb͕a anyam abua, N'ihi na ha edebeghi iwu-Gi.


Ahurum ndi nāghọb͕u nghọb͕u, m'we sọ ha oyi; N'ihi na ha edebeghi okwu-ọnu-Gi.


N'ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom; Ita-uta nile nke ndi nāta Gi uta adakwasiwokwam.


M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.


Ma otú ọ di mu onwem juputara n'ike, bú Mọ nke Jehova, na ikpé, na idi-ike, igosi Jekob njehie-ya, na igosi Israel nmehie-ya.


Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.


Ememe ngabiga nke ndi-Ju we di nso, Jisus we rigoro Jerusalem.


Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.


(Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.)


N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu.


Mb͕e ihe ndia gasiri o si n'Atens pua, bia rue Kọrint.


Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu:


N'ihi nka mb͕e ayi nāpughi inagide ọzọ, ọ di ayi ezi nma ka arapu nání ayi n'azu n'Atens;


O we dọputa Lot, bú onye ezi omume, mb͕e ibi-obi n'agu ikwa-iko nke ndi ahu ndi nēmebi iwu nēwuta ya nke-uku


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan