Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 15:4 - Bible Nso

4 Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Mgbe ha bịaruru Jerusalem, nzukọ, ndị ozi na ndị okenye nabatara ha, ha kọkwara ha ihe niile Chineke sitere nʼaka ha mee.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 15:4
20 Iomraidhean Croise  

Onye nānara unu nke-ọma, ọ bu Mu ka ọ nānara nke-ọma, onye nānara kwa Mu onwem nke-ọma nānara Onye ziterem nke-ọma.


nke ha me-kwa-ra, nēzigara ndi-okenye site n'aka Banabas na Sọl.


Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.


Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha.


Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a.


Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:


Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.


Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a.


Mb͕e ha nāgabiga n'obodo nile, ha we nēnye n'aka-ha iwu ahu idebe, bú nke ndi-ozi na ndi-okenye nọ na Jerusalem nyereri.


Mb͕e o zubere igabiga n'ofè ka ọ ba n'Akaia, umu-nna nime Kraist we me ka obi di ya ike, we degara ndi nēso uzọ Jisus akwukwọ inara ya nke-ọma: mb͕e o ruru, o yere ha aka nke-uku, bú ndi. kwereri site n'amara:


Mb͕e ayi ruru Jerusalem, umu-nna-ayi nime Kraist we were ọṅù nara ayi nke-ọma.


Mb͕e ọ kelerisi ha, o we kọ akukọ ihe nile n'otù n'otù nke Chineke lururi n'etiti ndi mba ọzọ site n'ije-ozi-ya.


N'ihi na m'gaghi-enwe anya-ike ikwu ihe o bula ma-ọbughi n'ihe nile Kraist lutara site n'akam, ime ka ndi mba ọzọ ṅa nti, n'okwu na ọlu,


N'ihi ya nākpọbatanu ibe-unu, dika Kraist-ayi kpọbata-kwa-ra unu, ka ewe nye Chineke otuto.


Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu,


Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),


Ọ buru na onye ọ bula abiakute unu, ma ọ wetaghi ozizí a, unu akpọbatala ya n'ulo, unu asi-kwa-la ya biri nke-ọma:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan