Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 15:1 - Bible Nso

1 Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ụfọdụ ndị ikom sitere Judịa bịa malitere izi ụmụnna ozi, “Ọ bụrụ na e bighị unu ugwu dịka Mosis nyere nʼiwu, a pụghị ịzọpụta unu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 15:1
25 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi nke-asatọ agēbì ya úgwù n'anu-aru nke api-ya.


Ọ bu n'ihi nka ka Moses nyere unu ibì-úgwù (ọ bughi na o sitere n'aka Moses, kama o sitere n'aka nna-ayi-hà); n'ubọchi-izu-ike unu nēbì kwa madu úgwù.


Na mb͕e ahu Pita we bilie n'etiti umu-nna nime Kraist, si, (ìgwè madu ndi nọkọrọ n'otù di kwa, ihe ra ka ọgu madu isi),


Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist:


ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu:


Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu;


Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile.


Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike.


Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses.


Mb͕e ha nuru ya, ha we nye Chineke otuto, ha we si ya, Nwa-nna-ayi, i huwo ka ha ra, bú ọtutu madu riri nne n'etiti ndi-Ju ndi kweworo na Jisus; obi ha nile nānu kwa ọku nye iwu-ayi:


n'ihi na ayi anuwo ya ka ọ nāsi, na Jisus nka, bú Onye Nazaret, gākwatu ebe a, nwo kwa ọme-n'ala nile nke Moses rara nye ayi n'aka.


Mb͕e ahu mb͕e arọ iri na anọ gasiri arigorom na Jerusalem ọzọ, mu na Banabas, m'kpọrọ kwa Taitọs ka mu na ya yikọ je.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


Ka ha ra, bú ndi nāchọ ka ha ma nma n'anu-aru n'iru madu, ndi ahu nērugide unu ka ebì unu úgwù; ihe ha ji me ya bu nání ka ewe ghara isob͕u ha n'ihi obe Kraist.


Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:


Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan