52 Ndi nēso uzọ Jisus we juputa n'ọṅù na Mọ Nsọ.
52 Ma ndị na-eso ụzọ ya jupụtakwara nʼọṅụ na nʼike nke Mmụọ Nsọ.
Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.
Ndi nēso uzọ Jisus, onye ọ bula ka ihe o nwere ra, we zube izigara umu-nna nime Kraist ndi bi na Judia ihe iyere ha aka:
Ha nile we juputa na Mọ Nsọ, ha we malite ikwu okwu n'asusu di iche, dika Mọ ahu nēnye ha ike ikwuwa okwu.
Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,
Mb͕e ha riọsiri aririọ, ewe me ka ebe ha nọ na nzukọ me nkpatu; ha nile we juputa na Mọ Nsọ, we were nkwuwa-okwu nēkwu okwu Chineke.
Ya mere ha siri n'iru nnọkọ-ikpé ahu la, nāṅuri na aguru ha na ndi kwesiri ka eme ha ihe-ihere n'ihi Aha ahu.
n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.
Ma Chineke nke olile-anya ahu mejue unu n'ọṅù nile na udo nile n'ikwe-ekwe, ka unu we nwebiga olile-anya ahu ókè, n'ike Mọ Nsọ.
Ma ọ bughi nání nka, kama ayi nānya kwa isi nime nkpab͕u-ayi nile: ebe ayi matara na nkpab͕u nāluta ntachi-obi;
na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha.
Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,
Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u;
Guanu ya n'ọṅù nile, umu-nnam, mb͕e ọ bula unu dabàra n'ọwunwa di iche iche;
kama ebe unu nwekọrọ ahuhu nke Kraist, nāṅurinu ọṅu; ka unu we were kwa obi nātọ utọ nke-uku ṅuria nime nkpughe nke ebube-Ya.