Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 13:5 - Bible Nso

5 Mb͕e ha ruru Salamis, ha we kwusa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke ndi-Ju: ha nwe-kwa-ra Jọn dika onye nējere ha ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe ha bịaruru Salamis, ha banyere nʼụlọ nzukọ ndị Juu kwusaa okwu Chineke. Jọn sokwa ha dịka onye na-ejere ha ozi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 13:5
20 Iomraidhean Croise  

O we si n'iso ya laghachi, were ehi abua ahu ejikọrọ n'otù, b͕ue ha, o were kwa ihe ehi ahu ji alu ọlu sie anu-ha, o nye ndi ahu, ha rie. O bilie, jeso Elaija, we jere ya ozi.


O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu.


Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija.


Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.


Ọ bughi otú a ka ọ gādi n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi;


Mb͕e ọ ghọtasiri ihe ahu, ọ bia rue ulo Meri nne Jọn onye akpọ-kwa-ra Mark; ebe ọtutu madu zukọrọri nēkpe kwa ekpere.


Banabas na Sọl we si na Jerusalem laghachi, mb͕e ha jezuru ozi-ha, nēkuru Jọn nke akpọ-kwa-ra Mark ya na ha yikọ je.


Ma ha onwe-ha sitere na Paga gabiga, bia rue Antiọk di na Pisidia; ha we ba nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, we nọdu ala.


Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.


O we rue n'Aikọniọm, na ha abua bàkọrọ n'ulo-nzukọ nke ndi-Ju, we kwue okwu n'uzọ nke mere ka oké ìgwe madu, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, kwere na Jisus.


Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je.


Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi.


O nēkwu kwa okwu n'ulo-nzukọ ubọchi-izu-ike nile n'otù n'otù, we nēme ka ndi-Ju na ndi-Grik kweye.


Mb͕e o zigasiri na Masedọnia madu abua nime ndi nējere ya ozi, bú Timọti na Erastọs, ya onwe-ya we nọdu n'Esia nwa oge.


Obodo ahu we juputa n'aghara ahu: ha we were otù obi nubà nime ebe anēkiri ihe, mb͕e ha jidesiri Gaiọs na Aristakọs, ndi Masedọnia, ndi nēso Pọl n'ije.


O we ba n'ulo-nzukọ-ha, we nēkwuwa okwu ogologo ọnwa atọ, nāgwa ha okwu n'ihe nile bayere ala-eze Chineke, nēme kwa ka ha kweye ha.


Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke.


Aristakọs onye adọkọrọ mu na ya n'agha nēkele unu, ya na Mak nwa-nne Banabas (onye unu natara ihe ufọdu enyere n'iwu bayere ya; asi na ọ biakute unu, naranu ya nke-ọma),


Nání Luk nọyerem. Kuru Mak, duru ya ka o so gi onwe-gi bia: n'ihi na ọ bu onye baram n'ihe ijerem ozi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan