Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.
n'ihi na ndikom ahu nile ndi huworo ebubem, na ihe-iriba-amam nile, nke M'meworo n'Ijipt na n'ọzara, ma ha nwaworom ub͕ò iri a, ha egeghi kwa olum nti;
Cheta, echezọla, ihe nke i ji kpasu Jehova, bú Chineke-gi, iwe n'ọzara: site n'ubọchi mb͕e i si n'ala Ijipt puta, rue mb͕e unu biaruru ebe a, ndi nānupu isi ka unu buworo n'ebe Jehova nọ.