Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 12:11 - Bible Nso

11 Mb͕e Pita mara onwe-ya, ọ si, Ub͕u a ka m'matara n'ezie, na Onye-nwe-ayi ziputara mọ-ozi-Ya, weputam n'aka Herod, ya na ile-anya nile nke ndi-Ju.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe niile mere. O kwuru, “Ugbu a, amatala m nʼezie, na Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya, ka ọ bịa zọpụta m site nʼaka eze Herọd na ihe niile ndị Juu na-atụ anya ya. Ugbu a ọ napụtakwala m site nʼọchịchọ ọjọọ niile nke ndị Juu.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 12:11
27 Iomraidhean Croise  

Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;


Jehova we si Abraham, Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka Sera chiworo ọchì, si, Ọ̀ gābu ezi-okwu na m'gāmu nwa, mb͕e mu onwem ghọworo agadi?


Abimelek we kpọ Aisak, si, Le, nwunye-gi ka ọ bu n'ezie: ì si kwa aṅa si, Nwa-nnem nwayi ka ọ bu? Aisak we si ya, N'ihi na asirim, Ka m'ghara inwu anwu n'ihi ya.


Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl:


N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.


Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!


Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi; Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.


N'ihi na O gēguzo n'aka-nri nke ob͕eye, Izọputa ya n'aka ndi nēkpe nkpuru-obi-ya ikpe.


Le, anya Jehova di n'aru ndi nātu egwu Ya, Bú n'aru ndi nēchere ebere-Ya;


Inaputa nkpuru-obi-ha n'ọnwu, Na idebe ha ndu n'oké unwu.


Jehova nāb͕aputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agaghi-ama kwa ha ikpe, bú ndi nile nāb͕abà nime Ya.


Mọ-ozi nke Jehova nāma ulo-ikwū-ya buruburu ndi nātu egwu Ya, Ọ we dọputa ha.


Jehova gēdebe ya, me ka ọ di ndu, agēme ka ihe gara ya nke-ọma n'uwa; Enye-kwa-la ya n'aka ọchichọ nkpuru-obi nke ndi-iro-ya.


Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì: Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya; Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.


Ọ zara, si, Le, mu onwem nāhu ndikom anọ atọpuru ab͕u, nējeghari n'etiti ọku ahu, ma emerughi ha ahu; onye ahu nke mere ha anọ yiri nwa nke ndi bu chi n'ile ya anya.


Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha.


Chinekem ezitewo mọ-ozi-Ya, we kpuchita ọnu ọdum ndia, ha emerughkwam aru: n'ihi na n'iru Ya ọ bu emeghi-ihe-ọjọ ka ahuru nimem; ọzọ kwa, n'iru gi, eze, ọ dighi ihe-imeru-aru m'meworo.


Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a!


Ma le, mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi guzoro ya nso, ìhè nwu-kwa-ra n'ime-ulo nke ulo-nkpọrọ: o we tie Pita aka n'akuku, kpote ya, si, Bilie ọsọsọ. Nkpọrọ-ya abua we dapu n'aka-ya abua.


Ma mb͕e arọ abua b͕azuru, Pọsiọs Festọs nọchiri ọnọdu Filiks; ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, Filiks we rapu Pọl n'ab͕u.


Ma Festọs, ebe ọ nāchọ inwe iru-ọma n'ebe ndi-Ju nọ, ọ zara Pọl, si, Ì n'achọ irigoro Jerusalem, ka akpe gi ikpé banyere ihe ndia n'irum n'ebe ahu?


Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi meghere ọnu-uzọ nile nke ulo-nkpọrọ ahu n'abali, we duputa ha, si,


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


Onye-nwe-ayi matara idọputa ha n'ọnwunwa, bú ndi nāsọpuru Chineke, na idebe ndi ajọ omume n'ahuhu-nmehie rue ubọchi ikpé;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan